Kedụ ndị ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa gọvanọ na steeti dị iche iche?

Aha onyonyo, Kedụ ndị ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa gọvanọ na steeti dị iche iche?
Kedụ ndị ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa gọvanọ na steeti dị iche iche?
Mgbe e biputara ya

Pati nọ n'ọchịchị na Naịjirịa bụ All Progressive Congress (APC) emeela ntuliaka ime ụlọ ha maka ha ma họpụta ụfọdụ ndị ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Gọvanọ dị iche iche.

Tupu ntuliaka aka ahụ amalite, ụfọdụ ndị chọburu ịzọ ọkwa ahụ sepụrụ aka ma nye ndị ogbo ha ohere ịbụ naanị ha ga-azọ ọkwa a.

Ụfọdụ ndị bụ Gọvanọ APC ugbua gara n'ihu nwete ọkọlọtọ ịzọ ọzọ ebe ndị oge ha ga-akụrụ ọnụ gara n'ihu họpụta ndị ha chọrọ ga-anọchi anya ha.

Lee ụfọdụ ndị nwetere ọkọlọtọ APC maka ịzọ ọkwa gọvanọ na steeti dị iche iche.

N'Abia Steeti, onye a kpọrọ Eric Opah tuuru ugo iji aha pati APC azọ ọkwa Gọvanọ n'afọ 2027

Opah nwetere akara vootu otu puku narị na puku iri abụọ na asaa iji merie Henry Ikoh zọsara ya ọkwa ahụ.

A họpụtagharịrị Gọvanọ Francis Nwifuru nke Ebonyi Steeti maka iji aha APC azọ ọkwa nke ugboro abụọ.

E mere nke a site na nkwekọrịta a kpọrọ Consensu na Bekee maka na o nweghi onye mara ya aka.

N'otu aka ahụ ka e si họpụta Gọvanọ Peter Mbah nke Enugwu Steeti ka o jiri ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa gọvanọ nke ugboro abụọ.

Cheta na Gọvanọ Mbah ji aha PDP banye n'ọchịchị mana o mechara hapụ ya banye APC n'afọ 2025.

Ndị ọzọ a họpụtara na steeti ndị ọzọ gụnyere Obafemi Hamzat bụ osote gọvanọ Legọs steeti, ka a họpụtara iji aha APC azọ ọkwa Gọvanọ.

A họpụtara onye omeiwu n'ụlọomeiwu nta bụ Kingsley Chinda maka iji aha pati APC azọ ọkwa Gọvanọ na Rivas Steeti.

Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Siminalaye Fubara kwuru na ọ gaghị esonye n'ịzọ ọkwa ahụ ọzọ.

Dịka ọ dị ugbua, pati ndị ọzọ dịka PDP, ADC, NDC, LP ka na-akwado ịme ntuliaka ime ụlọ nke ha.