Simon Ekpa: Nkọwa Ụlọikpe Finland nyere BBC maka mkpebi abali 15 nke Ọktoba, afọ 2026

Ebe foto si, Simon Ekpa x
Ụlọikpe Mkpegharị nke mba Finland akọwala na nwaafọ Nigeria bụ Simon Ekpa ka nọ n'ụlọmkpọrọ, dịka mkpebi e nyere ya n'abalị 15 nke ọnwa Ọktoba apụtaghị na a tọpụla nwaamadi ahụ.
N'abalị 15 nke ọnwa Ọktoba, afọ 2026, Ụlọikpe Mkpegharị nke mba Finland n'ikpe nke bu akara: R 17/2025/918, nyere mkpebi nke gbubiri afọ ole Ekpa ga-anọ na mkpọrọ site n'afọ isii gbatuo gaa afọ anọ.
Dịka akụkọ pụtara na Ụlọikpe Mkpegharị nke Finland nyere mkpebi ọhụrụ n'isi Ekpa, akụkọ na ihe onyonyo malitere fegharịwa na soshal midia nke na- ekwu na Ekpa enwerela onwe ya.
Mana ozi nke Aino Finnilä nke Ụlọikpe Mkpegharị mba Finland zitere BBC Igbo n'ọsịsa ajụjụ anyị jụrụ banyere mkpebi ụlọikpe ahụ kọwaram Ekpa ka bụ onye eji eji.
Ozi ahụ sịrị, "Ekpa ka nọ na mkpọrọ maka na mkpebi e nyere n'Oktoba 15, enyeghị ntuziaka ka a tọhapụ ya."
Finnilä gara n'ihu kwuo na mkpebi ahụ ekwughị kpọmkwem oge a ga-atọhapụ ya dịka ọ bụ Iwu mba Finland ga-ekwu mgbe nke ahụ ga-eme.
Kedụ ihe iwu Finland kwuru maka iwu onye nọ mkpọrọ?
Finnilä rụtụrụ aka na dịka Isiokwu nke Abụọ, Akụkụ nke Ise , Mpaghara nke Abuo nke Iwu Ppụ nke mba Finland, "Onye nọ mkpọrọ ga-enwe ohere ntọhapụ ma ọ nọ ụzọ abụọ n'ime atọ oge e nyere ya ịnọ na mkpọrọ."
O kwukwara si, "Ọ bụrụ na onye ahụ agabeghị mkpọrọ afọ ise tupu a ma ya ikpe, onye ahụ ga-enwe ohere i nwere onwe ya ma ọ nọ ọkara afọ ole a tụrụ ya mkpọrọ."
Cheta na a tụrụ Ekpa mkpọrọ n'afọ 2025 maka iji sohal midia akpalite iyi ọha egwu n'Ọwụwa Anyanwụ Nigeria n'agbata afọ 2021 na 2024.
Ebe ka mba Finland kwu na mkpebi ahụ?

Ebe foto si, Simon Ekpa/x
Ministrị mba Finland na-ahụ maka mmekọrịta mba ahu na mba ndị ọzọ gwara BBC Igbo na aka gọọmentị adịghị na mkpebi ahụ ụlọikpe nyeredịka, "Ngalaba Ikpe kwụụrụ onwe ya."
Mana ha rụtụrụ aka na e nwere ike 'ịgbaghara mkpebi nke abalị 15 nke ọnwa Oktoba afọ 2026 nke Ụlọikpe Mkpegharị nke Ọwụwa Anyanwu Finland nyere n'ikpe Simon Ekpa..
Ozi ha nke Linda Hyttinen binyere aka kwuru sị,"Mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị abụghị ebe okwu biri, nke pụtara na e nwere ike itinye akwụkwọ gbaghara ya."
Mịnịstrị ahụ rụtụrụu aka na Ụlọikpe Mkpegharị makwara Ekpa ikpe maka iyi ọha egwu dịka ụlọikpe kpeburu ikpe ahụ.
"Mkpebi ibelata ya bụ ọnọdụ ka e lere anya, dịka Ụlọikpe Mkpegharị nke Ọwụwa Anyanwụ Finland si kwuo. "




























