Etu ndị ojiegbe si wakpoo ma gbuo ndị uweojii abụọ n'Abia state

Ebe foto si, Abia State Police Command/X
Ndị uweojii abụọ anwụọla ebe ndị uweojii atọ ndị ọzọ merụrụ ahụ site na mwakpo ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Uratta nke dị n'okpuruọchịchị Aba Saụt n'Abia state n'ụbọchị Satọde 17 Ọktoba, 2026.
E kwuru na ndị ojiegbe ahụ ji ike banye n'ebe a na-eme ọzụzụ site n'akụkụ dị iche iche n'ihe dịka elekere 1:15 nke ụtụtụ, nke kpatara oke ọgbaghara mere ka ndị ọrụ nchekwa abụọ tụfuo ndụ ha na ya.
Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Wilfred Afolabi kwupụtara ọnwụ ndị uweojii abụọ ahụ ma kpọọ oku ka ndị uweojii kee nkwụcha iji gbochie ụdịrị mwakpo a ime ọzọ.
Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Alex Otti na-achị Abia state bịara njem mgbaru n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ.
Afolabi dugharịrị Gọvanọ Otti n'ogige ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ma gosi ya ụgbọala ndị uweojii a gbara ọkụ, igwe ọkụ latrik nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ e mebiri ma kwuo na a malitere ime nnyocha iji chọpụta ndị ojiegbe mere mwakpo ahụ ma nwụchie ha.
Afolabi gara n'ihu kelee Gọvanọ Otti maka nkwado o nyere ha tinyekwara nkwa o kwere ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị uweojii merụrụ ahụ na-enweta nleta n'ụlọọgwụ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
O zigaara ezinaụlọ ndị uweojii ahụ nwụrụ ozi iti aka n'obi maka ọnwụ ndị nke ha.
Afolabi kpọọrọ oku ka onye ọbụla nwere ozi nwereike inyere ndị uwojii aka na nnyocha iji chọpụta ma nwụchir ndị ojiegbe ahụ, ka ha kkpọtụrụ ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla dị ha nso.
Mwakpo a na-abịa dịka ndị ojiegbe wakporo ma gbuo ndịagha 17 n'ogige ọzụzụ ndịagha Nigerian Army Special Forces School dị n'okpuru ọchịchị Buni Yadi, Yobe n'ụbọchị Fraịde 8 Mee 2026.



























