Anyị agbanweghị usoro ọrụ Lagos-Calabar Coastal Highway - David Umahi

Aha onyonyo, Anyị agbanweghị usoro ọrụ Lagos-Calabar Coastal Highway - David Umahi
Anyị agbanweghị usoro ọrụ Lagos-Calabar Coastal Highway - David Umahi
Mgbe e biputara ya

Ọ bụ eziokwu na gọọmenti Nigeria akwụsịla ịrụ okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway?

Nke a bụ ajụjụ ọtụtụ mmdụ malitere ịjụ dịka akụkọ fesara na soshal midia na gọọmenti ahapụla ọrụ okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway ma kwuo na ọ bụzi okporoụzọ East-West Road ka ha malitere ịrụ.

Iji chọpụta nke bụ eziokwu, BBC kpọtụụrụ minista na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi, onye gwara anyị hoo ha na okwu ahụ abụghị eziokwu ma kọwaa na gọọmenti etiti Nigeria akwụsịghị ọrụ n'okporụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway.

Umahi kwuru na ọrụ ka na-aga n'ihu n'okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway nke ogologo ya dị 750km.

N'okwu ya "Okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway na-aga n'ihu karịa etu anyị tụrụ anya. Enweghị onye ọbụla hapụrụ okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway dị 750km. Ihe anyị mere bụ ịrịọ nkwado Onyeisiala Tinubu ka ọ gbakwụnye okporoụzọ East-West Roda dị ogologo 400km nke bidoro n'Edo state ruo Akwa Ibom nakwa Cross River state. Ọ bụ maka mgbakwụnye okporoụzọ East-West Roda dị ogologo 400km nke ọrụ ya na-agafeghị elu idemmiri."

Umahi gara n'ihu kwuo na ihe gọọmenti chọrọ ime bụ ịgbakwụnye ọrụ okporoụzọ East-West Road n'ime ọrụ Lagos-Calabar Coastal Highway.

Ọ kọwara na gọọmenti na-arụ ogologo 400km nke okporoụzọ East-West Road iji itinye ya n'ime ọrụ Lagos-Calabar Coastal Highway na-aga n'ihu ugbua.

Umahi kọwara na nke a abụghị oge mbụ gọọmenti na-eme ụdịrị mgbakwụnye ahụ maka na gọọmenti mere ya n'ọrụ okporoụzọ Akwanga-Maiduguri-Wukari-Langtan Road.

Ka ọ dị ugbua, Umahi kwuru na a malitela ime nnyocha na mpaghara ogologo ụzọ Lagos-Calabar Coastal Road ahụ dị n'Edo, Delta, Rivers state na Bayelsa state iji gbakwụnye ya n'agba 5 n'okporoụzọ Lagos-Calabar Coastal Highway dị n'Akwa Ibom state.