Etu NDLEA si nwuchie otu nwaanyị maka ebubo ibu ọgwụike na mmanụ nri
Ọ bụrụ na ị na-akwado ime njem mba ofesi mmadụ agwa gị ka i nyere ya aka wegara nwa ya, nwanne ya maọbụ enyi ya ihe, ihe onyonyo a bụ iji dọọ gị aka na ntị banyere ịdabanye n'ụdịrị ọnọdụ nwaanyị a ụlọọrụ na-ebu agha megide ụgwọike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) nwụchiri dịka ọ na-achọ ime njem mba ofesi.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ NDLEA bụ Femi Babafemi kwuru na ha nwụchiri otu nwaagbọghọ bu mmanụ nri na-akwado ime njem gaa mba Saudi Arabia.
Oge a nwụchiri ya ma nyochaa mmanụ nri ahụ, a chọpụtara ọtụtụ ọgwụike e kechiri n'ime mmanụ nri ahụ.
Oge a gbara nwaagbọghọ ahụ ajụjụ ọnụ, o kwuru na ọ bụ mmadụ nyere mmanụ nri ahụ ka o nye ya mmadụ na mba Saudi Arabia.
Ọ bụ nke a mere Babafemi ji kpọọ oku ma dọọ onye ukwu ma onye nta aka na ntị ka ha ghara ịnara mmadụ ihe ọbụla ma onye ahụ na-eme njem, ka i wee ghara itinye onwe gị na nsogbu nwereike iduba gị n'ụlọmkpọrọ.






