Nigeria Independence Day: Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Tinubu kwuru

Aha onyonyo, Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ Onyeisiala Tinubu kwuru n'ụbọchị nnwereonwe Nigeria
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu ekwela ụmụafọ Naịjiria nkwa na "ọganihu adịwala nso" dịka Naijiria na-eme emume ncheta afọ 66 o nwetara nnwereonwe n'aka mba Briten.

N'ozi ọ gbasara n'ụtụtụ Tọzde, Onyeisiala kwuru sị, na Nigeria agabigala nnukwu ihe isi ike mana ugbua ọ kwurula chịm na-aga n'ụzọ doro anya.

2. Onyeisiala chetaraa ụmụamaala Nigeria ebe Nigeria si malite ije ya, ebe a nọ na ebe a na-aga.

Ọ sịrị, "Nigeria edoziela ụzọ ya. Anyị agafeela Osimiri Uhie anyị. Ugbua abụghị oge anyị ga-ele anya n'azụ. Ka anyị jịkọta aka, gaa n'ihu n'okwukwe, okwukwe n'onwe anyị, okwukwe n'ala anyị , okwukwe na aja anyị chụrụ ga-amịta mkpụrụ."

3. Onyeisiala Tinubu kwwuru okwu inye olileanya

"Ala e kwere anyị na nkwa dị n'ihu anyị bụ Nigeria ebe ihe dị n'uju: obodo ebe a na-ekekọrịta ọganihu, ebe nwata ọbụla na-agbanyeghị ọnọdụ ọmụmụ ya na-enweta ihe ọ chọrọ, ebe nkwa obodo anyị na-apụta ihe na ndị ndị be anyị."

4. Tinubu kwuru na ọnọdụ akụnaụba Nigeria akala mma karịa otu ọ dị na mbụ.

" Ọtụtụ ụmụ Nigeria na-adọnị ịkpa nri ịkwụ ụgwọ akwụkwọ, ụgwọ ụlọọgwụ na ime njem. ihe ndị a abụghị nhaziharị akụnaụba nke afọ atọ gara aga butere ya. Ihe butere ya bụ arụpụtaghị ihe aọtụtụ afọ gara aga."

Bola Tinubu

5. "Anyị agaghị efisa n'afọ anọ, ihe ndị e mekọtarala agba kwuru agba."

Mana anyị ga-agbanwe ụzọ anyị. Anyị gaewulite akụnaụba ga-adọpụta ndị mmadụ n'ụbịam ma ahụ na ahapụghị ndị ihe dabidoro n'ụzọ."

"Anyị na-akwalite inyere ezinaụlọ dara ogbenye mgbeneke akac, ma hụ na-aha ndị enyemaka dị nnukwu mkpa dị n'akwụkwọ Bekee kpọrọ 'National Social Register' ka ihe enyemaka rute ha aka kpọmkwem."

Bola Tinubu

6. "Ogologo oge, ndị ndu Nigeria na-agwọ njirimara ọrịa ,hapụ ihe kpatara ya mana atụ anya na ihe nribama ga-eme."

"Anyị emefuola nnukwu ego n'antụmatụ atọghị atọ. Anyị na-agbara eziokwu na-afụ ụfụ ọsọ , ebe ihe so ya si agbọ gafee ọgbọ."

7. Oge ọchịchị anyị batara, anyị kpebiri ịmegharị etu e si eme ihe iji bechapụ ọrịa akpụ(cancer).

"Nhazigharị ahụ siri ike mana mpụtara ya pụtara ife.

"Nhazigharị akwadaghị akụnaụba.Ugbua ụfọdụ ndị ọrụ na-eru n'okwu chọrọ ka anyị hapụ ọgwụgwọ ọrịa gahachi na ego mbilata(subsidies) Mana anyị ga-ajụ nke a. Ka anyị cheta na anyị amalitela njem na ebe anyị garuola."