Ihe mere EFCC jiri kpụpụ Blessing CEO n'ụlọikpe

Aha onyonyo, Ihe mere EFCC jiri kpụpụ Blessing CEO n'ụlọikpe
Ihe mere EFCC jiri kpụpụ Blessing CEO n'ụlọikpe
Mgbe e biputara ya

Ọnya EFCC amaala Blessing CEO, onye ezigbo aha ya bụ Blessing Nkiruka Okoro, dịka ha kpụpụrụ ya n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị na Legọs maka ebubo izu ohi na iji ụzọ aghụghọ napụ mmadụ ego.

Ndị Ọkaiwu na-arụ ya aka ma na-ebo ebubo na Blessing CEO napụrụ otu onye nde naịra iri atọ na isii maka igonye ya ụlọelu nwere ọnụụlọ isii na Lekki dị na Legọs Steeti, mana eju olee nne gị, kokororom.

Ka o sina dị, Blessing CEO kwuru na aka ya adịghị n'ebubo ahụ, mana Ọkaikpe nyere iwu ka EFCC jichie ya ma tinyezie ikpe ya n'ụbọchị 5 Juun.

Cheta na okwu gbasara nwaagbọghọ a ka na-akpọtụ ebe niile, dịka ọ pụtara na nso nso a kwuo na ya nwere ọrịa kansa, nke mere ka ọtụtụ mmadụ tụkọtara ya ego, mana ụfọdụ n'ime ha na-eche na ọ mara ha aka n'akpa, nke mere ha ji na-akpọ oku ka o nyeghachi ha ego ha.

Mana, ihe a ọ bụ oge mbụ aka na-akpara Blessing CEO maka mpụ na omekome?

N'afọ 2023 ka ndị uweojii nwuchiri Blessing CEO maka itinye ọnụ n'okwu gbasara otu nwoke a ma ama na-ere ụgbọala bụ Ikechukwu Ogbonna, onye a maara nke ọma dịka IVD na nwunye ya nwụrụ anwụ bụ Bimbo.

A kpụpụrụ ya n'Ụlọikpe Ukwu dị na Legọs n'ụbọchị 31 Maachị, afọ 2023 maka ebubo nkwutọ, iji ogbe nzirịtaozi soshal midịa emekpa mmadụ ahụ nakwa igosipụta onyonyoo ndị na-ekwesịghị ekwesị gbasara ọnwụ Bimbo.

Ka e mesịrị, a tụkpuru Blessing CEO n'ụlọmkpọrọ, ma mechaa nye ya ntọhapụ.

N'afọ 2019 aka ndị uweojii kpaara nwaagbọghọ ahụ maka ikwu na ọ bụ ya nwe ụlọ otu nwoke aha ya bụ Onye Eze, mana ka e mesịrị, ọ rịọrọ mgbaghara n'ihu ọha.