Amerịka akwaala Ịran mgbọ maka ịwakpo 'Strait of Hormuz'
Mba Amerịka atụọla ogbunigwe ọhụrụ n'Ịran iji zaghachi ndịagha mba ahụ, maka ogbunigwe ha tụrụ n'ụgbọmmiri atọ na-agbafe n'ọwarammiri Strait of Hormuz.
N'ihi nke a, ndịagha Ịran bụ Islamic Revolutionary Guard Corps (IRGC) wakporo ogige ndịagha Amerịka na ndị na-agbakọọrọ ha aka na mpaghara Jọdan, ma kwupụta na ha emechiela ọwarammiri Strait of Hormuz ruo mgbe a na-amaghị.
N'ozi o wepụtara n'akara X ya, Mohammad Bagher Ghalibaf bụ Onyeisi Ụlọomeiwu mba Ịran nakwa onyeisi otu mkparịtaụka ha sịrị na "oge a gaala mgbe a na-eme atụmatụ na-adabara naanị otu onye".
Na mmalite izuụka gara aga ka Ịran wakporo ụgbọmmiri atọ oge ha na-achọ ịgbafere n'ọwarammiri dị nso n'akụkụ mba Oman nke mba Amerịka kwadoro, ma kwuo na ọ bụ n'ọwarammiri nke dị n'akụkụ mba ha bụ naanị ebe dị mma isi gbafee.
Ọnọdụ a emeela ka Amerịka kwaa mgbọ dị egwu n'Ịran, gbuo mmadụ 17 ma merụọ mmadụ 115 ahụ, dịka ndị ọchịchị Ịran siri kwupụta. Ịran n'onwe ha zaghachiri site n'ịtụ ogbunigwe n'ogige ndị na-agbakọọrọ Amerịka aka na mpaghara Gulf.
Cheta na mwakpo niile a na-abịa dịka Onyendu ọhụrụ Kachasị nke mba Ịran bụ Ayatollah Mojtaba Khamenei kwuru na ha ga-emegwara maka ogbugbu e gburu nna ya bụ Ayatolla Ali Kamenei n'ụbọchị mbụ Amerịka na Izrel jikọtara aka busoo Ịran agha.
Na nso nso a ka onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwuru na nkwụsị ịkwa mgbọ dị n'etiti Amerịka na Ịran agaala, ma kwuo na ndị nnọchiteanya Amerịka na Ịran nwereike gaa n'ihu inwe mkparịtaụka, mana ọ bụ oge ka ha na-egbu.
Amerịka sị na ha tụrụ ogbunigwe n'ogige 90 n'ime ụbọchị abụọ ha malitere ịwakpo Ịran, ebe Ịran n'onwe ha kwuru na ha tụrụ ogbunigwe n'ogige ndịagha Amerịka dị na Qatar, Kuwait na Bahrain. Nke a mere oge a na-akwado maka oliliozu Onyendu Kachasị nke mba Ịran bụ Ayatolla Ali Kamenei, onye mba Amerịka gburu n'ọnwa Febụwarị.



