Ihe mgbanwe 'visa' Amerịka ọhụrụ a ga-ebutere ụmụ Naịjirịa
Donald Trump bụ Onyeisiala mba amerịka achọọla itinye mgbanwe ọhụrụ n'usoro ndị mbịarambịa si abata mba Amerịka.
Mgbawe ọhụrụ a mere ka embassy mba Amerịka na mba dị icheiche kwụsịtụ ịga n'ihu na-agba ndị na-achọ akwụkwọ ikike njem nke bekee kpọrọ Visa ajụjụ ọnụ.
Mgbanwe ndị ahụ gunyere ibuli elu ego usoro visa nke ha kpọrọ 'H-1B' site n'ihe dị puku dọla abụọ maọbụ puku dọla ise ($2000/$5000) ruo otu narị puku na puku dọla atọ ($103,000)
Ọzọ bụ ịkwụsị ndị ga-eje mba Amerịka dịka ndị ọbịa ma nọrọ n'ebe ahụ tinye akwụkwọ nzere ndụ nke bekee kpọrọ 'Asylum'.
Mana, gịnị bụ H-1B Visa nakwa etu mgbanwe ọhụrụ a si metụta ụmụ Naịjirịa?
H-1B visa bụ usoro ụlọọrụ dị icheiche n'Amerịka si akpọbata ndị mba ọzọ ka ha bata Amerịka bido ọrụ ma na-arụrụ ha ọrụ.
Cheta n'afọ 2024 ka ụlọọrụ dị icheiche n'Amerịka kwadoro ma kpọbata ndị Naịjirịa ruru narị asatọ na iri asatọ (880) n'Amerịa.
Mgbenwe na H-1B visa pụtara na ọtụtụ ụlọọrụ n'Amerịka agaghị enweike kwadoo maọbụ kpọbata ndị Naịjirịa ọzọ maka na ụgwọọnwa ha na-akwụ ndị Naịjirịa n'otu afọ adịghị elughị otu narị puku dọla ($100,000); nke pụtara na ego vịsa akarịala ụgwọọnwa otu afọ.
Gọọmenti Onyeisiala Donald Trump na-ekwu na nke a ga-egbochi ndị mba ọzọ ịbata na-enwere ọrụ ụmụ amaala mba



