Ihe mere ọtụtụ ndị njem jiri tọọ n'okporoụzọ awarawa si Benin gawa Asaba kamgbe ọtụtụ ụbọchị

Aha onyonyo, Ihe mere ọtụtụ ndị njem jiri tọọ n'okporoụzọ awarawa si Benin gawa Asaba kamgbe ọtụtụ ụbọchị
Ihe mere ọtụtụ ndị njem jiri tọọ n'okporoụzọ awarawa si Benin gawa Asaba kamgbe ọtụtụ ụbọchị
Mgbe e biputara ya

Ajọ ọnọdụ okporoụzọ awaraawara si Ore gawa Benin, abụrụla okwu a kpụ n’ọnụ n’ihi ọtụtụ ndị njem tọrọ n’okporoụzọ ahụ ruo ọtụtụ awa.

Ụfọdụ ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ụfọdụ ndị na-eme njem tọrọ n’okporoụzọ ahụ ebe ha na-akpọ oku ka gọọmenti gbatara ha ọsọ enyemaka.

Ụfọdụ ndị njem kwuru na ha anọọla n’ụzọ ahụ ihe karịrị abalị abụọ ma katọọ nkịtị gọọmenti gbara banyere ajọ ọnọdụ okporoụzọ ahụ kemgbe ọtụtụ afọ.

Mana ọ bụ gịnị kpatara mkpọchi okporoụzọ a ugbua?

Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi kwuru na ya enwetela ozi banyere afụfụ ndị njem na-ata n’okporoụzọ awaraawara si Ore gawa Benin ma kwuo na gọọmenti ga-elebanye anya n’ụzọ.

Oge ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụọnụ, David Umahi kwuru na ihe kpatara mkpọchị nke tinyere ndị njem n’oke ihe mgbu.

"Echi niile, anyị ga-aga n’okporoụzọ si Benin gawa Asaba, achọrọ ka ụmụafọ Naịjirịa niile mara na ngwangwa anyị ruru ebe ahụ, anyị ga-edozi nsogbu ahụ.

"Ọ bụghị mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ kpatara ya. Ihe kpatara ya bụ mbọ anyị gbara inye ụlọọrụ ndị nkịtị nwee dịka etu e si eme ya n’ebe ndị ọzọ.

"Mana ndị ụlọọrụ a bịara kpochapụ korota dị n’okporoụzọ ruru kilomita iri atọ, tufuo ya, machie ụzọ ahụ ma pụọ. Nke tinyere ọtụtụ mmadụ n’afụfụ taa.

"Anyị na ndị injinịa ụlọọrụ ahụ na ndị ọkaiwu anyị nakwa Gọvanọ Edo steeti ga-enwe mkparịtaụka banyere ọnọdụ ụzọ a."

Kemgbe ọtụtụ afọ, ajọ ọnọdụ okporoụzọ si Ore gawa Benin na Asaba abụrụla okwu a kpụ n’ọnụ nke mere ka ọtụtụ mmadụ malite ịjụ ajụjụ banyere ihe kpatara na okporoụzọ a ji dịrị etu a n’agbanyeghị ijeri kwuru ijeri ego gọọmenti na-amapụta maka ịrụ okporoụzọ ahụ na bọjeti Naịjirịa kwa afọ.