Ihe m ga-eme onye ọbụla zuru vootu m - Aisha Yesufu

Aha onyonyo, Ihe m ga-eme onye ọbụla zuru vootu m - Aisha Yesufu
Ihe m ga-eme onye ọbụla zuru vootu m - Aisha Yesufu
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Nwaanyị a ma ama na-akpọ oku maka ezi ọchịchị na Naịjirịa bụ Aisha Yesufu ekwupụtala ihe ọ ga-eme onye ọbụla maọbụ pati ọbụla ga-achọ izuru vootu ya n'oge ntuliaka afọ 2027.

Aisha Yesufu kpughere nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche gbasara ọnọdụ Naịjirịa nakwa ntuliaka a na-akwado ịhazi n'afọ 2027.

Oge a jụrụ ya ihe ọ ga-eme iji chekwaa vootu ndị ọ ga-enweta n'oge ntuliaka, Yesufu sịrị: "Mụ onwe m bụ Aisha Yesufu agaghị arụrụ aka. Agaghị m emetụ vootu onye ọzọ aka. Mana a tụnyere m vootu, onye ọzọ chọọ izuru ya, mụ na onye ahụ ga-eri nkịta nwụrụ anwụ."

Na nso nso a ka Aisha Yesufu kwupụtara mmasị ya iji aha pati Nigerian Democratic Congress (NDC) zọọ ọkwa Sịnetọ maka ịnọchịteanya isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.

O kwuru na ebumnobi ya bụ iburu ọkpụkpọ oku maka ezi ọchịchị banye na ndọrọndọrọ ọchịchị.

"Ana m agwa ọtụtụ mmadụ ndị na-ekwu na m chọrọ ịhapụ ọkpụkpọ oku maka ezi ọchịchị, banye na ndọrọndọrọ ọchịchị sị anaghị m ahapụ ya, kama achọrọ m iburu ya gaa na ndọrọndọrọ ọchịchị".

"Ị hụla ihe ndị ahụ anyị na-eme mgbe anyị si n'ezi na-akpọ oku, ọ bụ eziokwu na iwu kwadoro anyị ịkpọ oku ndị ahụ, mana anyị chọrọ ikike nke iwu iji banye n'Ụlọomeiwu nke steeti maọbụ nke etiti iji kpọọ oku maka ụmụ mmadụ," ka Yesufu gwara anyị.

Gbasara ọnọdụ Naịjirịa taa, Aisha Yesufu kwuru na Naịjirịa nke ochie dị mma karịa nke ugbua, n'ihi na ọtụtụ arụ ndị na-eme ugbua anaghị eji ike eme n'oge ọchie.

"Ana m echeta oge m na-agwa nna m ihe mere o kweghị ka Naịjirịa nke ochie rute m aka, maka na nna m na-akọrọ m etu mmadụ abụọ si ata otu anụ ọkụkọ oge ha nọ na mahadum, m na-ajụ ihe mere o kweghị ka Naịjirịa nke ahụ rute m aka, mụ onwe m enweghịkwa ike inyefe ụmụ m ụdị Naịjirịa nke ahụ".

"Anyị nwere ego na ihe niile ugbua mana anyị enweghị udo. Anyị amaghị gbasara enweghị nchekwa etu anyị si ahụta ya ugbua. Ọtụtụ ihe na-eme ugbua, ntọrị na ihe ndị ọzọ, ọtụtụ arụ na-eme na Naịjirịa taa, ejighị etu a mee oge ahụ."

Aisha Yesufu kwuru na ya chere na ọkpụkpọ oku ya gbasara ezi ọchịchị kemgbe ọtụtụ afọ na-amịta ezi mkpụrụ.

"O nwere oge m na-akpọ oku maka ụzọ ihe ise n'otu mgbe na Naịjirịa, ugbua enwere m ike ịnọdụ ala na-emeghị ihe ọbụla, ihe a na-ewu, maka na ọtụtụ ndị Naịjirịa enweela olu, ọtụtụ ndị Naịjirịa amalitela ikwu okwu. N'uche m, nke a bụ ezigbo ihe ịtụnaanya."

Aisha Yesufu bụ nwaafọ Edo Steeti a maara nke ọma maka oku ndị ọ na-akpọ maka ezi ọchịchị na Naịjirịa.

Ọ pụtara ihe n'oge a na-akpọ oku ka a kpọghachi ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị Boko Haram tọọrọ bụ 'Bring Back Our Girls'. Ọ bụkwa otu olu dara ụda n'oge e mere ngagharịiwe megide mmekpaahụ ndị uweojii, nke a kpọrọ 'End Sars'.