“Na mbido, anyị ji tyre ụgbọala arụ akpụkpọ ụkwụ.” Ndị na-arụ akpụkpọ ụkwụ
Ndị na-arụ akpụkpọụkwụ n’Aba akọwaala etu e si malite ịrụ akpụkpọụkwụ n’Aba di n’Abia steeti.
Otu n’ime ha bụ Ogbonnaua Udeh kọwara na ọ bụ n’afọ 1970 ka a malitere ịrụ akpụkpọụkwụ n’Aba.
“A malitere iji afọ ụgbọala arụ ya n’ebe a na-akpọ Eke Ọha.”
“Mgbe o ruru n’afọ 1980, Mbakwe ewuo ahịa Arịarịa, ndị niile nọ n’ebe ahụ abatazie n’Arịarịa, ebe a na-akpọ ‘Old Sites’”, ka Maazị Ogbonnaya Udeh kọwara.
Maazị Udeh gara n’ihu kwuo na ọ bụ mgbe o ruru n’afọ 1994, ka a chụpụrụ ndị na-arụ akpụkpọụkwụ na Powerline na Imo Avenue ma chụgaa ha ebe a na-akpọ Bakassi, nke bụ Ụmụehilem Industrial Market.
Ọ gwara BBC News na ọ bụ n’ụbọchị 18 Mee, 1995 ka a gbapere Aba North Shoe Plaza.
Onyeisi ndị na-arụ akpụkpọụkwụ n’Aba North Shoe Plaza bụ Maazị Obioma Onyebuchi gwara anyị na akpụkpọụkwụ a na-arụ n’Aba nwere ogogo dị iche iche.
Onye ọzọ na-arụ akpụkpọụkwụ n’Aba bụ Maazị Christian Okoro mere ka anyị mara na o nwere ndị na-achọ akpụkpọụkwụ dị ọnụ ala ma nweekwa ndị na-achọ nke ogogo ya dị elu.
Maazị Okoro kwuru na ha na-arịọ ndị na-azụ ha ahịa, ka ha chọọ akpụkpọụkwụ mara mma oge ha chọrọ ịzụ akpụkpọụkwụ.
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara ịrụ akpụkpọ ụkwụ anyị
Maazị Ogbonnaya Udeh kọwara na ihe mere ha na-edee na a rụrụ akpụkpọụkwụ n’Ịtali bụ maka na akpụkpọụkwụ a rụrụ n’Ịtali na-amasị ndị na-azụ ha ahịa.
Maazị Christian Okoro kwuru na ihe na-eme ka akpụkpọụkwụ nọtee aka bụ na i kwesịghị inwe naanị otu akpụkpọụkwụ.
“Anyị na-anabata ụmụnwaanyị ma ha bịa, ma ọ bụrụ na ha ga-ewezuga ihere,” ka Maazị Okoro kowara.
O mekwara ka anyị ghọta na ha na-akuziri ndị ntoroọbịa etu e si arụ akpụkpọụkwụ.
Ndi na-arụ akpụkpọụkwụ n’Aba North Shoe Plaza gara n’ihu rịọ ka gọọmentị nyere ha aka site n’ibinye ha ego maọbụ onyinye ego ka ha nwee ike zụọ akụrụngwa ọhụrụ e ji emepụta akpụkpọụkwụ.



