You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tarị Naịra 3.3 Tinubu kwadoro maka ngalaba ọkụ latrik, ọ ga-eme ka ọkụ na-enwu oge niile?
Onyeisiala Bola Tinubu akwadola atụmatụ iji kwụchapụ ụgwọ niile e jikọrọ ngalaba na-ahụ maka ọkụ latrik, site n'ihe omume a kpọrọ Presidential Power Sector Financial Reforms Programme.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bayo Onanuga mere ka anyị mata nke a n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde 5 Eprel 2026.
Onanuga kọwara na atụmatụ a gbasoro nnyochagharị akatamkpo ụgwọ e jikọrọ ngalaba ọkụ latrik kemgbe ihe karịrị afọ iri.
Dịka o siri kọwaa, gọọmenti jikọrọ ụgwọ ndị ahụ n'agbata Febụwarị 2015 na Maachị 2025.
Ọ sịrị na dịka ha mechara nnyocha, ha kwekọrịtara ịkwụ tarị Naịra atọ na ụma atọ (N3.3tr) iji weta okwu ahụ na njedebe.
Bayo Onanuga kwuru na a malitela ịkwụ ụgwọ ahụ, dịka ụlọọrụ ọkụ latrik iri na ise binyere aka na nkwekọrịta ọnụego ya dị tarị Naịra abụọ na ụma atọ (N2.3tr).
O mere ka a mata na Gọọmenti Naịjirịa amawapụtalarị narị ijeri Naịra ise na otu (N501bn) iji kwado ụgwọ ndị a.
Onanuga kwukwara na e kesaala narị ijeri Naịra abụọ na iri abụọ na atọ (N223bn) n'ime ego ahụ, dịka a ga-agakwa n'ihu na-akwụ ụgwọ ahụ.
N'ozi ahụ, Onanuga sịrị na Onyeisiala Tinubu kelere ndị niile nwere aka oke maka nkwado ha nakwa mbọ niile ha na-agba iji hụ na e doziri nsogbu niile na-echere ngalaba ọkụ latrik aka mgba.
Ozi ahụ sịrị Tinubu gara n'ihu kwupụta na ogogo nke ọzọ (agba nke abụọ) ga-amalite n'ọkara afọ a.
Kedụ uru ndị Naịjirịa ga-erite site n'ihe omume a?
Bayo Onanuga kọwara na dịka a maliterela ịkwụ ngalaba ọkụ latrik ụgwọ ndị e jikọrọ ha, ọ ga-eme ka ha na-esipụta ọkụ latrik dịka o kwesịrị.
Ọ sịrị na site na nkwado a ga-enye ụlọọrụ ndị na-esipụta ọkụ latrik, nke ahụ ga-enye aka kwalite nkesa ọkụ latrik gburugburu Naịjirịa.
Ọ gara n'ihu kwuo na dịka ngalaba ọkụ latrik ga-akwụrụ chịm, ọ ga-ekepụtakwu ohere ọrụ, kpọta ndị na-etinye ego ma mekwaa ka ọrụ na-aga nke ọma.
Na mgbakwunye, Onye Ndụmọdụ Pụrụiche nye Onyeisiala n'ihe gbasara ikike bụ Olu Arowolo-Verheijen kọwara na "ihe omume a abụghị naanị iji kwụchapụ akatamkpo ụgwọ ndị e jikọrọ, kama ọ bụ iji weghachi ntụkwasịobi na ngalaba ọkụ latrik."
Olu Arowolo-Verheijen sịrị na ọ bụrụ na a kwụọ ndị na-ekesa ọkụ latrik ụgwọ e ji ha, ụlọọrụ ndị na-esipụta ọkụ ga-aga n'ihu na-arụ ọrụ, nke ga-eme ka ngalaba ahụ malite ịrụ ọrụ dịka o kwesịrị.
O kpughere na ihe gọọmenti ga-eji kpọrọ ihe dị oke mkpa ga-abụ ikesara ndị na-azụ ahịa, ụlọọrụ mmepụta ihe na ụlọọrụ ndị na-ebuchaghị ibu ọkụ latrik.
Dịka o siri kwuo, inwe ọkụ latrik oge niile dị mkpa n'ikepụta ohere ọrụ, ịkwado usoro mkpata ego dị iche iche nakwa iwulite ọnọdụ akụnaụba.