Gịnị mere VeryDarkMan jiri tụọ Blord nga ụbọchị 26?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka a kpọchie onye a ma ama na-achụnta ego dijitalụ bụ 'cryptocurrency' olu bekee n'ụlọmkpọrọ Kuje dị n'Abuja maka ebubo mmadụ ikwu na ọ bụ onye ọbụghị, ime ihe adịgboroja na nkwupụta ụgha.

A tụrụ Linus Williams Ifejirika bụ onye a ma ama dịka 'Blord' na soshal midịa mkpọrọ dịka Martins Vincent Otse, onye a maara nke ọma dịka 'VeryDarkMan' kpụpụrụ ya ụlọikpe maka ebubo imetọ aha ya.

Ebubo ọhụrụ a mepere ụzọ ọhụrụ n'esemokwu a na-arị elu n'etiti mmadụ abụọ ahụ.

Na nzara ọnụ ya, BLord kwuru na aka ya dị ọcha n'ebubo ndị ahụ mana ka ọ dị ugbua, ikpe ahụ ka na-aga n'ihu n'ụlọikpe.

Kedụ etu esemokwu a siri malite?

Esemokwu dị n'etiti Blord na VeryDarkMan (VDM) malitere mgbe VDM katọrọ Blord maka akụrụngwa 'app' ya bụ 'BillPoint' ma na-ebo ya ebubo na ndị na-eji akụrụngwa app ya azụahịa na-atụfu ego n'ihe ruru nde naịra.

VeryDarkMan gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ BillPoint anaghị anabata maọbụ lebara mkpesa ndị ahịa ha anya nke ọma.

Akụkọ na-efegharị na soshal midịa kwuru na Blord nzaghachiri ihe VeryDarkMan kwuru n'ụdị mkparị nke e kwuru na ọ kparịrị nne mụrụ VeryDarkMan.

Nke a mere ka esemokwu ahụ si na nkatọ gaa n'ịbu ajọ iwe n'obi n'etiti ha abụọ.

Ụlọmgbasaozi mpaghara kwuru na esemokwu ha ahụ kporo ọkụ karịa mgbe VeryDarkMan boro Blord ebubo na ọ na-ebubata n'ahịa Naịjirịa ekwentị 'iPhone' nke o kwuru na a rụgharịrị arụgharị ma na-ere ha n'ọnụego ego dị elu.

E kwuru na Blord kwere nkwa inye onye ọbụla wetere ya vidiyo ebe VeryDarkMan gbaa ọtọ na-egosi ihe o jiri bụrụ nwoke mana VeryDarkMan tiri aka n'obi wee jiri aka ya wepụta ihe ndị ahụ n'onwe ya.

VeryDarkMan mechara gba akwụkwọ mkpesa n'aka ndị uweojii Naịjirịa, nke butere ndị uweojii jiri nwụchie Blord n'ọnwa Julaị afọ 2024, n'ihi ebubo gụnyere wayo ego dijitalụ na ịtụ mgbere ego.

Akụkọ kwukwara na a tọhapụrụ Blord n'aka ndị uweojii ka ọ nọrọchara ụbọchị ole na ole.

Na mbido afọ 2026, esemokwu ahụ gbanwere gaa n'izuru akara azụmahịa nke a kpọrọ 'trademark' n'olu bekee.

E kwuru na Blord wepụtara akụrụngwa app nke a kpọrọ 'Ratel' bụkwa aha otu ndị na-akwado VeryDarkMan, nke mere ka VeryDarkMan kwuo na ya edebanyela aha 'Blord' dịka akara azụmahịa ya n'ụdị azụmahịa dị iche iche.