Ihe mere ụlọọrụ INEC ji wepụ aha David Mark dịka onyeisioche ADC

Aha onyonyo, Ihe mere ụlọọrụ INEC ji wepụ aha David Mark dịka onyeisioche ADC
Ihe mere ụlọọrụ INEC ji wepụ aha David Mark dịka onyeisioche ADC

Ọ bụghịzị ihe ọhụrụ na ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National electoral Commission (INEC) kwuru na ha agaghị anabata David Mark dịka Onyeisioche Otu Ndọrọndọrọ Ọchịchị All Democratic Congress (ADC).

INEC gbadoro ụkwụ n'ikpe dị n'etiti David Mark na Nwoke a na-akpọ Nafiu Bala Gombe n'ụlọikpe.

Nafiu Bala kpụgara otu ADC, David Mark na INEC ụlọikpe, na-azọ sị na ya bụ Onyeisioche nchere ego nke patị ahụ.

Bala gwara ụlọikpe na ya bụ naanị Osote Onyeisioche na-esoghị ndị niile na-achị ADC dee akwụkwọ na ya arịtuola n'ọchịchị tupu David Mark arịgoro.

Bala kwuru na iwu pati ADC nyere ya ikike ịbụ onyeisioche nchere oge.

Na nkenke, ọ bụ ikpe a nakwa iwu ụlọikpe nyere mere ụlọọrụ INEC gi wepụ aha David Mark dịka Onyeisioche ADC ma kwuo na ha agaghị anabata Nafiu Bala Gombe dịka Onyeisioche ADC ruo na ụlọikpe enye mkpebi.

Mana otu Pati ADC nakwu na Nafiu Bala na Ralph Nwosu rituru n'ọkwa n'Ọktoba 2025 ma jiri ohere ahụ wepụta ma kesaa akwụkwọ ha kwuru na Nafiu Bala dere na-ekwu na ya arịtuola n'ọkwa.