Ụfọdụ ndị a sị na-arịa ọrịa akịrị na Naịjiria bu ọrịa obi bụ nsogbu ha - Dọkịnta Ohaju
Ugochukwu Ohaju bụ dọkịnta na-awa ahụ ma bụrụkwa onye hiwere ụlọọrụ 'VOOM Foundation' nke mba Amerịka bu otu ọrụ ebere ji ịgwọ ọrịa obi eme ọgọọ.
Ohaju na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka na nsonso a, oge ọ bịara njem ọrụ ahụike ebere na Naịjiria ebe ọ rụtụrụ aka na e nwere nsogbu ịchọpụta kpọmkwem ihe na-arịa ọtụtụ mmadụ.
Ọ kwuru sị, "Ị ga-anụ mgbe na mgbe ndị na-arịa ọrịa oge terela aka, a na-agwo nke a, na-agwokwa nke ọzọ, tupu a mata na ọ bụ ọrịa obi ka onye ahụ nwere."
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
"O nwere ike, ihe o jiri gaa hụ dọkịnta bụ na ụkwụ ya azaala, e mee ya nnyocha ọbara, were hụ na akịrị ya anaghị arụ ọrụ etu o kwesịrị. A na-agwọ akịri mana ihe o jiri nwe nsogbu akịrị bụ na obi ya anaghị arụ ọrụ nke ọma."
Dọkịnta Ohaju gara n'ihu kọwapụta ụfọdụ njirimara ọrịa obi a na-ahụkarị n'Ọwụwa Anyanwụ na etu e si elekọta ndị na-arịa ya.
Kirie ya n'uju:



