Etu ndị Igbo si eme ndọrọndọrọ ụka na-agbawa m obi-Timothy Ofoegbu

Aha onyonyo, Timothy Ofoegbu: Etu ndị Igbo si eme ndọrọndọrọ ụka na-agbawa m obi
Etu ndị Igbo si eme ndọrọndọrọ ụka na-agbawa m obi-Timothy Ofoegbu
Timothy Ofoegbu
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Onye dere ya, Anthony Okwudei
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Onye dere ya, Chinonso Nnachi
  • Mgbe e biputara ya

Otu onye ọnụ na-erụ na okwu n’Igbo bụ Timothy Ofoegbu akatọọla etu okpukperechi Ụka Kraịstị si ebute nkewa n’Ọwụwa Anyanwụ kama ijikọta ndị mmadụ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere , nwa amadị ahụ bụ onye na-akụziri ndị mmadụ etu e si ahazi ndụ nke Bekee kpọrọ ‘Life Coach’ dụrụ ndị Igbo ọdụ ka ha ṅomie ndị Yoroba na-etu ha esighị ekwe ka okpukprechi wetara ha nkewa n’ezinaụlọ ha.

Ọ sịrị,"Ihe niile a na-azọ; 'Abụ m Katọlik', 'Abụ m Anglịkan', Onye 'pentekọstal'..N'ihe gbasaara ndọrọndọrọ nke ụka, ihe ndị Igbo na-eme na-ewute m, ọ na-agbawa m obi."

"Ka anyị legharịgodị anya hụ etu ndị agbataobi anyị bụ ndị Ọdịda Anyanwụ, ndị Yoroba, etu ha sị eme ekperemchukwu: I bata n'ụfọdụ ezinaụlọ n'ala Yoroba, nna nwere ike bụrụ onye na-akpọ isi ala,onye ụka Alakụba,nne abụrụ onye otu Kraịstị, dịọkpara abụrụ onye 'Cherubim and Seraphim',ada abụrụ onye Jehovah Witness,nke nọ n'etiti abụrụ onye ụka Katọlik, nke ikpeazụ abụrụ onye ụka 'Mountain of Fire and Miracle' mana ha niile na-ebi n'udo. O nweghị onye na-asọ nne na nna ya oyi."O nweghị onye na-atụ nwanne ya ụjọ."

"Mana n'ala Igbo anyị, ụfọdụ ndị Katọlik,ekweteghị na ndị ụka ọzọ ga-aga eluigwe.enweta."

Kirie ya n'uju ebe a: