Umaru Altine: Ị ma nwoke Fulani a bụ 'Mayor' Enugwu?

Mallam Umaru Altine bụ Meyọ (nke Bekee kpọrọ Mayor) na mpaghara ụfọdụ n'Enugu steeti.

Altine bụ onye mbụ meriri ntuliaka maka ọkwa Meyọ nke afọ 1952, wee chịa ruo 1958.

Ọ chịrị n'ebe anyị ma ka Enugwu municipal council n'Enugwu steeti ugbua.

Ọ zọrọ ọkwaọchịchị site n'otu patị NCNC ya bụ National Council of Nigeria and the Cameroons; nke Herbert Macaulay hibere n'afọ 1944.

Onyeisiala mgbe ahụ bụ Nnamdi Azikiwe sokwa n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị NCNC n'oge ahụ.

Ọ bụkwa otu patị a ka onye onyeisiala Naịjirịa nke mbụ bụ Nnamdi Azikiwe jiri baa ọchịchị.

Gịnị ka anyị ma maka Malam Umoru Altine?

  • Ọ bụ onye Fulani si Sifawa na Sokoto.
  • O meriri ntuliaka ugboro abụọ.
  • Ọ na-ere ehi n'Enugwu.
  • O nwere nkwado Nnamdi Azikiwe ka o wee bụrụ onye izizi Meyọ Enugwu.
  • O jiri vootu 117 merie DT Inyang chịtara vootu 58.
  • Ọ chịrị site n'afọ 1952 ruo 1958.
  • Ọ chịrị tupu Naịjirịa enwereonwe n'afọ 1960.

Olee ihe Meyọ na-eme?

  • Dịka 'Ide Mbanọ' bụ Goddy Uwazuruike si kwuo, onye Meyọ bụ onye nchịkọta ihe a mara ka okpuruọchịchị ise maọbụ isii taata.
  • Uwazuruike kwuru na onye ji ọkwa Meyọ na-elekọta ọtụtụ ihe. Ha gụnyere: ọdịmma okporoụzọ, ụlọakwụkọ, ahịa, nchekwa obodo nakwa ọdịmma ndị bi na ya.

Ụfọdụ ndị dere maka Altine na-ekwu na ọ lụrụ nwaanyị Igbo mana o nwebeghi ihe gosiri ya kpọmkwem.

Ka ọ dị taa

Ọ bụ eziokwu na ọ rara ahụ ịhụ onye si mpaghara ọzọ na Naịjirịa imeri ntuliaka na mpaghara na-abụghị nke o si pụta, mana ọ ka na-eme.

Taa, onye Igbo, Emeka Idimogu, so na ndị omeiwu na Legọs steeti.

Idimogu meriri ntuliaka n'afọ 2015 nakwa 2019.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: