You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Rabiu Kwankwaso: Kedụ ihe ọ pụtara dịka ọ banyere pati ADC?
Onye ji bu 'New Nigeria People's Party (NNPP)', Rabiu Kwankwaso abanyela pati 'African Democratic Congress (ADC)' n'ụbọchị Tuezde abali iri atọ nke ọnwa Macchị.
Rabiu Kwankwaso onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa Naịjirịa debanyere aha ya na pati ADC ma nara kaadi nsonye ya na mpaghara Gidan Kwankwasiyya nọ na okporoụzọ Miller dị na Bompai, Kano steeti.
O kwupụtara ndebanye aha ya na ọbaozi X ya ma kwuo na nkea bụ "ọgba ọhụrụ. Anyị bụ ADC"
Nkea na-abịa otu ụbọchị dịka ọ hapụrụ pati NNPP. N' akwụkwọ arụkwaghịm odere, ọ sị na ọ dị mkpa ya nwa isonye pati ga-enye ohere ịtụgharị ọnọdụ Naịjirịa
Ọtụtụ ndị a ma ama na pati ADC nakwa ndị nkwado bịara emume ahụ nke gunyere David Mark onye bụbu onyeisi Sịneti Naịjirịa, Onyeisioche pati ADC Rauf Aregbesola, Peter Obi onye bụbu gọvanọ Anambra.
Ndị ọzọ kwa bụ aka na-achị Sokoto steeti, Aminu Tambuwal, onye bụbu minista na-ahụ maka njem Rotimi Amaechi, Dino Melaye, onye bụbu onyeisioche pati APC John Odigie-Oyegun, onye bụbu gọvano Imo steeti, Emeka Ihedioha.
Cheta na ọnwa Jenụwarị Kwankwaso gwara ndị na-eso ya na onwere pati ndị ha na ya na-enwe mkparịtaụka ma kwuo na ọnọdụ ọ ga-eji esonye ha bụ ma ha nye ya tiketị iji pati ha zọọ ọkwa onyeisala maọbụ osote onyeisiala n'afọ 2027.
Ugbua, onwebeghị onye odoro anya ma ADC o kwere ya nkwa ahụ mana onye na-ekwuchitere ADC bụ Bolaji Abdullahi kwuru na enweghị ọnodụ pụrụiche Kwankwaso ji banye pati ha.
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị New Nigeria Peoples Party (NNPP) ekwuola na ha ga-agbakọrọ pati African Democratic Congress (ADC) aka n'oge ntuliaka onyeisiala.
Odeakwụkwọ mgbasaozi pati NNPP bụ Ladipo Johnson kpughere nke a n'ụbọchị Mọnde 30 Maachị 2025 oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka n'ụlọmgbasaozi Channels TV.
Ladipo kwuru na ndị NNPP ga-esonye na ntuliaka a ga-ahazi n'afọ 2027 n'agbanyeghị ọpụpụ onye jiri ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 bụ Rabiu Kwankwaso.
Dịka o siri kwuo, NNPP ga-aga n'ihu zọọ ọkwa ndị ọzọ, mana ha ga-agbakọọrọ ADC aka na ntuliaka onyeisiala.
Ọnụ na-ekwuru NNPP sịrị na ha na ndị ndu pati na-agba gọọmenti ụkwụ nwere mkparịtaụka ọtụtụ oge tupu Kwankwaso ekpebie ịbanye ADC.
Ladipo mere ka o doo anya na ndị ndu pati ndị na-agba gọọmenti ụkwụ na-arụkọ ọrụ maka ọdịmma ndị Naịjirịa, ma kwuo na Kwankwaso ga-edebanye aha na pati ADC n'ụbọchị Mọnde 30 Maachị 2023.
Kwankwaso banyere NNPP n'afọ 2022.
Mana NNPP abụghị Pati Kwankwaso, lee otu pati ndị ọzọ ọ nọbụ na ha:
- Peoples Front of Nigeria (1989)
- Social Democratic Party (1989–1993)
- All Progressives Congress (2014–2018)
- Peoples Democratic Party (1998–2014; 2018–2022)
Gịnị mere Kwankwaso jiri hapụ NNPP banye ADC?
Atụmatụ Rabiu Kwankwaso ịhapụ NNPP banye ADC bụ nke sochiri mkpọtụrụ kpụ ọkụ n'ọnụ n'etiti onye ahụ bụbu gọvanọ Kano Steeti, ndị ndu otu Kwankwasiyya Movement nakwa ndị a ma ama na pati ADC.
N'ime izuụka ole na ole ugbua, onye ahụ na-achọ ịzọ ọkwa onyeisiala na ndị isi kara aka enweela ọtụtụ nzukọ, nke gụnyere ndị ọnụ na-eru n'okwu na pati ndị na-agba gọọmenti ụkwụ.
Nke a bụ otu akụkụ mbọ ọ na-agba ịkwalite mbịakọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche, nke nwereike ịma aka megide pati na-achị achị bụ All Progressives Congress (APC).
N'izuụka gara aga ka Kwankwaso zutere ndị ndu pati nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na Kano Steeti, iji dọta nkwado maka atụmatụ o nwere ịgbanwe pati.
Ya na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama nwere mkparịtaụka, nke gụnyere Nnukwu Odeakwụkwọ ADC bụ Rauf Aregbesola; onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 bụ Peter Obi; aka na-achị Ọyọ Steeti bụ Seyi Makinde nakwa sịnetọ na-anọchiteanya Bayelsa West bụ Seriake Dickson.
Ọnọdụ a na-abịa dịka e nwere esemokwu ọjọọ n'etiti Kwankwaso na Abba Yusuf bụ "nwa ndọrọndọro ọchịchi ya" ma bụrụkwa aka na-achị Kano Steeti, maka ịhapụ NNPP banye APC.
Gịnị ka ị kwesịrị ịma maka Rabiu Kwankwaso?
Ezigbo aha ya bụ Mohammed Rabi'u Musa Kwankwaso.
Ihe e jiri mara ya bụ na ọ bụ aka chịbụrụ Kano steeti site n'afọ 1999 ruo 2003 ma baakwa n'ọchịchị site n'afọ 2011 ruo 2015.
Ọ bụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama na mpaghara ugwu ma na Naịjirịa niile.
Aka ọrụ ya bụ ọrụ Injinịa na-arụ igwe.
Kwankwaso soro zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023
Ọ lụọla nwunye ma mụọ ụmụ.