Ntuliaka 2019: Bukola Saraki ekwuola na ya anataghị ngarị ọbụla

Saraki

Ebe foto si, Facebook

Mgbe e biputara ya

Onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki agọrọla ụkwụ na aka ya na ya anaghị ngarị ọbụla dịka otu ihe so na mkparịtaụka na-aga n'etiti onyeisiala na otu pati APC.

Ọ kwuru na okwu ahụ bụ asị ma kọwaa na ihe a na-ekwu maka ya bụ ọdịnaihu ala Naịjirịa na ọchịchị ya nke onye ọbụla na-ekwu maka ihe e nyere na nke enyeghi na-achọghị ọganihu obodo.

N'akwụkwọ onye nkwuchiteọnụ ya bụ Yusuph Olaniyonu dere, Saraki kwuru na ya hụrụ ụfọdụ akụkọ na-ekwu maka ego na ọmị mmanụ na akwụkwọ ikike ịzọgharị ọchịchị mana kwuo na ndị na-ahụa ihe na-eme ugbua etu ahụ na-ahụta ihe gbasara ala niile dịka ihe gbasara naanị ha.

N'okwu ya; "Ọ dị mkpa ka ụmụ Naịjirịa mata na mkparịtaụka m na ọtụtụ ndị ọzọ na-eme gụnyekwara ụlọọrụ onyeisiala na ndị otu pati APC abụghị maka onwe m na ihe m chọrọ.

"Ọ bụ maka ọdịnihu ala anyị na ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ bụ maka ime ka ihe dị mma nye ndị ala anyị".

"Anyị ga na-akparị ụmụ Naịjirịa ma ọbụrụ na dịka ntuliaka 2019 nabịa, ihe ka anyị mkpa abụrụ ihe gbasara onwe anyị."

Saraki na ndị isi otu pati APC na-enwe mkparịtaụka maka kepu kepu na-ekwu na ọ chọrọ ịpụ na pati ahụ banye patị ke si na APC kewapụa nke a kpọrọ R-APC.

Onwebeghi ihe Saraki kwuru kemgbe e kewapụtara pati ọhụrụ ahụ mana ọ bụ ndị obi adịghị mma nọ n'ụlọomeiwu n'APC bụ ndị kewapụtara pati nke ha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ