Ọ bụghị eziokwu na ndị uweojii nwụchiri m n'Abuja - Rochas Okorocha

Aha onyonyo, Ọ bụghị eziokwu na ndị uweojii nwụchiri m n'Abuja - Rochas Okorocha
Ọ bụghị eziokwu na ndị uweojii nwụchiri m n'Abuja - Rochas Okorocha
Mgbe e biputara ya

Isi ụlọọrụ ndị uweojii Naịjirịa dị n'Abuja kwuru na ha nwụchiri aka chịburu Imo State bụ Rochas Okorocha n'abalị Mọnde 12 Ọktoba, 2026.

Aniete Iniedu bụ ọnụ na-ekwuru isi ụlọọrụ ndị uweojii Nigeria gwara ndị mgbasaozi, na ha nwụchiri Okorocha n'Abuja, mechaa tọhapụ ya na beelụ ka o ruru otu elekere a gbachara ya ajụjụ gbasara ebubo ịkpa nkata ọjọọ, iwepụta ozi adịgboroja na ikwu na ya bụ onye ọ na-abụghị, ma gwakwa ya ka ọ laghachi n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'ụbọchị Tuzde maka ịga n'ihu na nnyocha a na-eme ya.

Ma n'abalị Mọnde ka Rochas wepụtara ihe onyonyoo na-egosi mgbe ọ na-eme na Facebook, kwuo na ya ka nọ n'ụlọ ya dị na Maitama Abuja. N'onyonyoo ahụ, a hụrụ ka Okorocha nọ n'oche n'ime ụlọ ya, ebe ụfọdụ ndị nkwado ya ji ọchị na-akọwa na o nweghị ihe mere Owelle.

N'ozi o mere ka o ruo BBC aka n'ụbọchị Tuzde 13 Ọktoba 2026, odeakwụkwọ mgbasaozi Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo kwuru na ụlọikpe nọọrọ n'ụbọchị 14 Septemba, kagbuo ikike ha nyere n'ụbọchị 9 Septemba 2026 ka a nwụchie Owelle, nke mere o jiri jụọ etu ikike a akagburu akagbu ga-eji bụrụ ihe a ga-eji rụọ ọrụ n'ọnwa Ọktoba.

Ọnọdụ a na-abịa dịka e bugharịrị akụkọ na Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja nyere iwu ka a nwụchie Sịnetọ Rochas Okorocha maka ebubo ịkpa nkata rụọ mpụtara adịgboroja nke ntuliaka imeụlọ otu APC, bụkwanụ nke Rochas pụtara kemgbe kọwaa na ọ bụghị eziokwu.