Ndị uweojii akọwaala ka ụmụokorobịa abụọ si gbuo ndị ezinaụlo ha n'Enugwu

Aha onyonyo, Ndị uweojii akọwaala ka ụmụ okorobịa abụọ si gbuo ezinaụlo ha n'Enugwu
Ndị uweojii akọwaala ka ụmụokorobịa abụọ si gbuo ndị ezinaụlo ha n'Enugwu
Mgbe e biputara ya

Obodo Ukehe dị n' Ọkpuru Ọchịchị Igbo-Etiti, Enugwu steeti nọ na nnukwu iru uju ugbua.

Ọ bụ n'abalị 15h nke ọnwa Mee ,afọ 2026 ka Onyekachi Anikwe gbara afọ iri anọ ji mma obejiri bepụ nne ya isi.

Nwaanyị ahụ o gburu bụ Felicia Anikwe gbara afọ iri isii.

Dịka ozi kọmishọna uweojii Enugwu bụ Mamman Bitrus Giwa binyere aka siri kọwaa, arụ ahụ mere na Nkorogwu ukehe n’ehihe ụbọchị ahụ.

Ndị obodo kwuru na ihe onyonyo na-efeghari na soshal midia na nwoke ahụ kwuru na nne ya enyeghị ya nri oge ọ batara, na ọ bụ ya bụ iwe ya o jiri gbuo ya.

Giwa kwuru na ndị mmadụ tiri nwaokorobia ahụ ihe tinka tiri pan tupu uweojii akpara ya aka buga ya ụlọọgwụ.

Ozi ahụ kọwakwara na nwaokorobia ọzọ onye Ekwegbe,aha ya bụ Joshua Eze miirikwaara obejiri bepụ isi nwanne ya nwaanyi bụ Nwabuche Eze na obere nwatakiri nwaanyi ya bụ Favour Eze.

N' ihe onyinyo nọ na soshal midia, nwoke ahụ bu isi nwatakiri ahụ a kpọrọ, 'Favour'.

Uweojii kwuru na o liri ozu nwanne ya nwaanyi na nwata ahụ ma likwaa ọkụkụ ọcha, nke mere e jiri si na ọ bụ ọgwụ-ego ka o jiri ha gwọọ.

Ndị obodo Agu-Ekwegbe tiri onye ogbu mmadụ ahụ ihe tinka tiri pan nke kpatara o jiri nwuo ka e bugara ya ụlọọgwụ.

Kọmishọna Giwa dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ ghara iji aka ha eti ndị mere arụ, ma ọ bụ gbakọọ n’igwe gbuo ha, kama ha were onye ahụ nyefee na-aka ndị Uweojii ga eme nnyocha, taa onye ahụ ahụhụ etu o kwesiri.