Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa ebinyela aka n’akwụkwọ nkwekọrịta udo
Onyeisiala Tinubu nke pati APC, Atiku Abubakar nke pati ADC, Peter Obi nke pati NDC, Omoyole Sowore nke pati African Actionc Congress nakwa ndị ọzọ na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa nakwa ndị na-azọkwa ụlọomeiwu Sineti na ụlọnnọchiteanya, ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke a a kpọrọ 'National Peace Accord' dịka achụmnta vootu maka ntuliaka afọ 2027 malitere n'ụbọchị Wenezde 19 Ọgọst, 2026.
Ndị bịara memme ibinye aka ahụ nke e mere n'ogige Bola Ahmed Tinubu International Conference Center dị n'Abuja gụnyere onyeisioche ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Ince) bụ Joash Amupitan, odeakwụkwọ gọọmenti Naịjirịa George Akume bụ onye nọchitereanya Onyeisiala Bola Tinubu na mmemme ahụ, ndịisioche pati ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche nakwa ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.
Gịnị bụ National Peace Accord?
National Peace Accord bụ akwụkwọ nkwekọrịta udo nke ụlọọrụ National Peace Committee (NPC), na-achịkọba, ma bụrụkwa ihe mbụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ga-ebinye aka na ya tupu ha amalite achụmnta vootu.
Ndị ji okoloto pati ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla azọ ọkwa nakwa ndịisi pati ndọrọndọrọ ọchịchị, ga-ebinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta udo a ma kwe nkwa na ha ga-eme achụmnta vootu ha n'ụzọ iwu kwadoro, ghara iweta tiguo zọgbuo n'obodo maọbụ nupuisi n'iwu e hiwere maka achụmnta vootu.
National Peace Accord dị agba abụọ.
A na-ebinye aka n'agba nke mbụ ya tupu a malite achụmnta vootu ebe agba nke abụọ bụ oge mpụtara ntuliaka gbara n'awnụ ka a na-eme ya.
A malitere National Peace Accord n'afọ 2014 tupu e mee ntuliaka afọ 2015.
Onyeisiala Bola Tinubu nke ọ bụ George Akume nọchitereanya ya na mmemme ahụ, toro Abdulsalami Abubakar; Eze ọdịnala Sokoto bụ Muhammad Sa'ad Abubakar nakwa Bishọpụ Matthew Hassan Kukah bụ ndịisi National Peace Commission (NPC) maka mbụ ha na-agba iji hụ na e nwere udo na ntuliaka na Naịjirịa.
Omoyele Sowere, Donald Duke nakwa ndị ọzọ na-azọ ọkwa onyeisiala, kpọrọ oku ka ha niile rube isi nye nkwekọrịta udo a ha binyere aka na ya ma rubeisi nye iwu e ji eme ntuliaka na Naịjirịa.
Peter Obi ji ohere mmemme ahụ gwa ndị Naịjirịa niile ka ha ghara itụrụ onye ọbụla nupuruisi nye ihe nkwekọrịta udo a kwuru ma kpọọ oku ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kpaa agwa e ji ama atụ.
Mana ọtụtụ mmadụ jụrụ ihe mere Atiku Abubakar ji ọkọlọtọ pati African Demcratic Congress (ADC) azọ ọkwa onyeisiala ji abịaghị mmemme ahụ.
Ọnye ndụmọọdụ mgbasaozi Atiku Abubakar bụ Abdulrasheed Sharada, gwara anyị na Atiku Abubakar abịaghị mmemme ahụ mbinye aka ahụ n'ihi ụfọdụ ihe o ji n'aka ma kwuo na ndịisi pati ADC nọchitere anya ya na mmemme ahụ.
Abdulrasheed Sharada mere ka o doo anya na Atiku Abubakar kweneyere na nkwekọrịta ahụ ma kwuo na Atiku Abubakar ga-abịa agba nke abụọ National Peace Accord ahụ.
Achụmnta vootu maka ntuliaka ọkwa onyeisiala nakwa ndị ụlọomeiwu Sineti na ụlọnnọchiteanya nke malitere n'ụbọchị Wenezde 19 Ọgọst 2026, bụ n'ụchị Fraịde 15 Jenụwarị 2027 ka ọ ga-akwụsị.
A ga-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala na ntuliaka ụlọomeiwu Sineti na ụlọnnọchiteanya n'ụbọchị Satọde 16 Jenụwarị, 2027.
N'aka nke ọzọ, achụmnta vootu maka ọkwa gọvanọ nakwa ụlọomeiwu steeti ga-amalite n'ụbọchị Wenezde 9 Septemba 2026 ma kwụsị n'ụbọchị Fraịde 5 Febụwarị, 2027.
Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na ụlọomeiwu steeti n'ụbọchị Satọde 6 Febụwrị, 2027, ka a ga-eme ya.
A gaghị eme ntuliaka ọkwa gọvanọ na steeti asatọ gụnyere Anambra, Bayelsa, Edo, Ekiti, Kogi, Ondo, Osun nakwa Imo steeti tuliaka na steeti n'afọ 2027.
Nke a bụ maka na steeti ndị a so na steeti na-enwe nke bekee kpọrọ off-cycle election' na ya.



