You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ugboro ole e merela mwakpo na Plateau Steeti n'ime otu afọ
N'ụbọchị Sọnde 29 Maachị 2026 ka ndị ojiegbe mere mwakpo n'obodo Angwan Rukuba dị n'ọchịchị ime obodo Jos North nke Plateau Steeti, gbuo opekatampe mmadụ 24 ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.
Onyeisiala Naịjirịa bụ Ahmed Bola Tinubu agaala njem nleta na Jos ma kwee nkwa itinye igwe onyonyoo CCTV 5,000 iji hụ na a chọtara ndị kpara mkpamkpa ahụ.
Plateau bụ steeti dị na mpaghara etiti ugwu Naịjirịa nke isi obodo ya bụ Jos. A na-akpọ steeti ahụ "ebe obibi udo na njem nlegharịanya" mana kemgbe otu afọ ugbua, steeti a enwebeghị udo.
Tupu mwakpo nke a mere na nso nso a, lee ugboro ole na ole e merela mwakpo na steeti ahụ
Na ngwụcha ọnwa Maachị 2025, mmadụ iri ise na abụọ nwụrụ na mwakpo e mere na mpaghara ọchịchị ime obodo Bokkos.
Otu ọnwa nke a mechara, ya bụ n'Eprel 2025, e mere mwakpo ọzọ na mpaghara ọchịchị ime obodo Bassa. Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ iri ise nwụrụ, nke gunyere ụmụnwaanyị na ụmụaka.
N'ọnwa Mee 2025 - Ihe ruru mmadụ iri anọ na abụọ nwụrụ n'ihi nsogbu dapụtara n'etiti ndị na-achị ehi nakwa ndị ọrụ ugbo na mpaghara Riyom.
Ọnwa abụọ nke a mechara, ya bụ na Julaị 2025 - Ndị ojiegbe gburu mmadụ ruru iri abụọ na asaa na Bindi dị na Jebu nke nọ na mpaghara Tahoss n'ọchịchị ime obodo Riyom.
Ọgụ dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị Fulani na-achị ehi bụ nke a na-ahụkarị ugboro ugboro na Plateau Steeti, mana ugbua, Onyeisiala Tinubu ekwela nkwa na ya ga-eweghachi Jos etu ọnọdụ ya dị na mbụ.