Ebumnobi m bụ igosipụta omenala ndị Africa na mba ofesi - Aura King
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Monday Idara
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Chigozie Nwodo a maara dịka Aura King bụ nwaafọ Enugu state toro n'Onitsha Anambra state ma bụrụkwa onye na-egosipụta ejiji ndị Igbo nakwa agbụrụ ndị ọzọ n'ịntaneetị.
O kwuru na ya bụ onye omenala na-amasị kemgbe ọ bụ onye na-etolite etolite nke mere ndị mmadụ ji etu ya igwe.
"Mgbe m na-etolite, ihe omenala doro m anya. Ndị enyi m na-ahụta m ka, ha na-etu m aha dịka 'igwe'. Ọ bụghị taa ka aha ahụ bidoro," ka ọ kọwara. 'Aura' dị n'aha m bụ iji mee ka ọ daba n'ụdịrị ejiji m na-eji. Ọ bụ ya bụ 'Aura' dị n'aha m. Omenala bụ ihe dị anyị n'ahụ.
End of Akụkọ ndị ọzọ yiri nke a
Aura King kwuru na ụfọdụ ndị ọcha amaghị na ụfọdụ ejiji bụ nke ndị Igbo n'ihi na ha na-ahụ ya n'ọkpụụlọ 'museum' ndị mba ofesi.
"O nwere nwaanyị gwara m na ụdịrị akwa a bụ ndị, amaghị m obodo nọ n'Europe o kwuru na ọ bụ ha nwe ya. Maka na ha na-aga n'ọkpụụlọ ebe ahụ ikiri ya. Mana ha amaghị na ọ bụ n'Afrịka ka o siri gaa n'ọkpụụlọ ahụ ha na-ekiri ya," ka ọ kọwara.
Igosipụta ejiji na omenala ndị Africa edugaala Aura King obodo dị iche iche na mba United Kingdom.
Ọ sịrị: "O nweela emume m haziri na Scotland. Mmọnwụ pụtachara, ndị egwu bịara. Ndị mmadụ a na-enwe aṅụrị. Ndị ọcha a ka nkụ. Ha jụkatara m ajụjụ n'ụbọchị ahụ, ike agwụ m. M na-akụziri ha ihe dị na ya."
Aura King kwuru na ebumnobi ya n'ọdịnihu bụ ịhazi nnukwu emume iji kọwaara ndị mmadụ gbasara omenala ndị Africa, tinyekwara ide akwụkwọ ga-akọwapụta nke a.
"Ana m ele anya n'ọdịnihu, na m ga-achọ ihe m ga-eme n'obodo a ga-abụ onye chọọ ịma maka anyị, ọ bịa emume ahụ. Maọbụ akwụkwọ a ga-ede ka ndị mmadụ na-agụ. Ụmụ ihe niile a bụ ebumnobi m," ka o kwuru.





