Ndị Igbo kwesịrị iji ngala asụ asụsụ Igbo - Professor Onyegwu

Aha onyonyo, Ndị Igbo kwesịrị iji ngala asụ asụsụ Igbo - Professor Onyegwu
Ndị Igbo kwesịrị iji ngala asụ asụsụ Igbo - Professor Onyegwu
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Onye dere ya, Chinonso Nnachi
  • Mgbe e biputara ya

Otiegwu Johnpaul Chukwubuikem Aniekwe a ma ama díka 'Professor Onyegwu' agbarụọla ihu banyere etu ndị Igbo ụfọdụ si eme ihere maka ebe ha sị maọbụ asụsụ na omenala ha.

Nwaamadi ahụ bụ onye na-akụ egwu 'highlife' bụ onye e jiri egwu ya bụ 'A chụta ego, a chụwa nwaanyị' were mara kwuru na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a sị, "O nwere ebe ị ga-aga ị hụ ụfọdụ ndị Igbo, ọ di ka ha a na-eme ihere asụsụ ha,ebe ha sị pụta. ya bụ ihe gbagwojuo m anya."

"Anọọla m ebe m nọ, ndị Igbo na-asụ asụsụ ọzọ,na-asụ ya ka ọ bụ ha nwe ya,mana ọ dazịa n'ịsụ Igbo, a na-asị gị na 'ị dị Igbotic', na m dị 'local.' M na-asị, kedụ ka m si dị 'local,' ebe m na-asụ ebe m bụ?"

Otiegwu a, onye kọwara maka ije ya n'iti egwu nakwa etu ya na otiegwu Flavour si mata, gara n'ihu nye ndị ntorobịa ndụmọdụ sị, "Ọkụkọ na-akpa nri, anya efiele ya. Ihe ọbụla ị na-eme, kpakọ onwe gị ofụma."

O kwukwara sị, "Enweghị ihe doro anya ị chọrọ ime na ndụ (purpose) na-ebute mbikasịka. Ebe ahụ isi na mkpụrụ obi gị dị, mewe ya."

Kirie ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo a:

Onye bụ 'Professor Onyegwu'

Professor Onyegwu

Ebe foto si, Professor Onyegwu/Facebook

Professor Onyegwu bụ otiegwu 'highlife'

A mụrụ ya n'Otolo Nnewi dị n'Okpuru Ochịchị Nnewi-Nọt, Anambara steeti

Ọ gụrụ 'Microbiology na mahadum 'Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University',Uli, Anambra steeti.

O tipụtala ọtụtụ egwu nke gụnyere 'Onye Igbo' wdg.