Ihe mere m ji malite ejije arịrịọ ịkpaọchị - Motell

Aha onyonyo, Ihe mere m ji malite ejije arịrịọ ịkpaọchị - Motell
Ihe mere m ji malite ejije arịrịọ ịkpaọchị - Motell
    • Onye dere ya, Michael Ngene na Chinonso Nnachi
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Motell Solomon Ovat onye e ji Motell mara, ekwuola na ọ bụ maka na o toro n'ogige nwere ọtụtụ ndị arịrịọ mere o ji malite ime ihe ịkpaọchị gbadoro ụkwụ n'arịrịọ.

Na mkpatarịụka ya na BBC News Igbo nwere, Motell kọwara etu njem ya dịka onye na-eme kọntent si malite nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ banyere ya.

Motell bụ onye Cross Riva steeti, kwuru na ọ bụghị naanị ihe ịkpaọchi ka ọ na-eme.

"Ana m eme skit ma bụrụkwa onye na-eme MC na mmemme na onye ji ego achụ ego", ka o kwuru.

N'okwu ya "Agara m akwụkwọ na Ákwá Ibom steeti. Agụrụ akwụkwọ praịmarị na sekondri ebe ahụ tupu m gaa mahadum na Calabar. Mana agụchaghị mahadum maka enweghị ego, mana anyị ga-amalitekwa ọzọ".

Motell kwuru na ụbịam nyere ya nsogbu nke mere o ji chọpụta na enwere ọtụtụ onyinye akara aka Chukwu nyere ya.

Maka ihe mere o ji malite ihe ịkpaọchị na-enwe ntakịrị oge, Motell kwuru na ọ chọpụtara na ọtụtụ mmadụ enweghị oge ikiri oyonyo toro ogologo. O mere ka o doo anya na ejije ịkpaọchị ọ na-eme ugbua, bụ alo ọ tụrụ ọtụtụ ndị enyi ya mana ha emeghị ya.

"Agwara ụfọdụ ndị enyi na-eme ejije ịkpaọchị ka ha mee ụdịrị ihe m na-eme ugbua mana ha anabataghị ya, ọ bụ ya mere m ji mee ya ma hụ na ọtụtụ mmadụ hụrụ ya n'anya".

Motell gara n'ihu nye ndị na-eto eto ndụmọdụ ma kwuo na ya onwe ya mụtara ọtụtụ ihe n'aka ụfọdụ ndị ka ya n'emume ejije ịkpaọchị. Ọ bụ ihe ndị ahụ Motell mụtara n'aka ha mere ejije ịkpaọchị ya ji bụrụ ọpụrụiche n'ebe ọtụtụ ejije ịkpaọchị ndị ọzọ na-emepụta.