Etu ị ga-esi mara atụmatụ pọnzi

Aha onyonyo, Etu ị ga-esi mara atụmatụ pọnzi
Etu ị ga-esi mara atụmatụ pọnzi
Mgbe e biputara ya

MMM, CBEX, Hamster, Get Help, Chinmark Investment nakwa National Reading Culture (NRC) gịnị jikọrọ ha niile?

Ihe doro anya bụ na ha niile si na ha ji ego ndị mmadụ achụ ego. Mana oge eteghị aka, ha kuchiri ma buru ijeri kwuru ijeri ego ndị mmadụ rie mbo mbo ọsọ.

Nke na-ewu ugbua bụ National Reading Culture (NRC), bụ ụlọọrụ malitere na Naịjirịa na Nọvemba 2025 ma kwe ndị mmadụ nkwa na ego ha ga-amụbawanye n'ime izuụka ole na ole ma ha tinye ego ha ma mee ụfọdụ ihe dị iche iche dịka ịgụ akwụkwọ, ikiri ihe onyonyo nakwa ikesa ma kpọbata ndị enyi ha.

Ha mepere webụsaịt ebe ọtụtụ mmadụ gara debanye aha ha ma tinyekwa ego.

Mana njiji jiri n'ụbọchị Tuzde 7 Julaị, 2026 oge ọtụtụ mmadụ tinyere ego ha na NRC chọpụtara na webụsaịt ụlọọrụ ahụ akụchiela.

Ọ bụ oge a ka ụfọdụ matara na NRC egwuole ha chandum ma buru ego ha rie mbo mbo ọsọ.

Ụfọdụ ndị tinyere ego ha na NRC anyị gbara ajụjụ ọnụ na-achọghị ka a kpọọ aha ha, kwuru na ha amaghị ihe ha ga-eme.

Otu nwoke gwara anyị na ya amaghị ihe ọ ga-akọrọ ndị enyi ya na ụfọdụ ndị ezinaụlọ ya ọ ọ gwara ka ha tinye ego ha na NRC.

Otu nwaanyị kwuru na ọ bụ ego ụgwọ akwụkwọ ụmụaka ya ka o tinyere na NRC mana ugbua, ọ maghị ihe ọ ga-eme.

Mana nke a bụghị oge mbụ ụlọọrụ dị etu a nke bekee kpọrọ 'ponsi' na-ewu ewu na Naịjrịa.

Ndị maara ihe ekwe na-akụ maka akụnaụba kwuru na ọ bụ ajọ ọnọdụ akụnaụba obodo na-eme ka ọtụtụ mmadụ na-adanye n'aka ụlọọrụ ponsi ndị a.

Mana kedụ etu ị ga-esi mara ụlọọrụ ndị na-egwu ndị mmadụ chandum a kpọrọ ponzi n'olu Bekee?

Ikechukwu Emmanuel bụ onye mara ihe ekwe na-akụ banyere ego na akụnaụba, kọwara ọtụtụ ụzọ gị na-ekiri ihe onyonyo a ga-eji mara ụlọọrụ ponzi.

Nke mbụ o kwuru na ụlọọrụ ọbụla kwere gị nkwa ime ka ego I tinyere mụbawanye karị pasenti 30 maọbụ 60% n'ime ọnwa isii, biko gbaara ụlọọrụ dị etu ọsọ.

Nke abụọ, ụlọọrụ ọbụla na-ekwughị hoo ha ihe ha ga-eji ego I tinyere mee nakwa etu ha ga-esi mee ya, Waaa!

Nke atọ Ụlọọrụ ọbụla na-akọrọ gị ihe ndị ọzọ ritere ma na-akwanye gị ka isonye na ngwa ngwa, biko narie!

Nke anọ, Ụlọọrụ ọbụla na-agwa gị tinye ego mana ha enweghị ndị a ma ama na ha bụ ndị eziokwu ma bụrụkwa ndị ihe gbasara ego doro anya, biko gbapụ ọsọ.

Nke ise, ụlọọrụ ọbụla ị na-amaghị onye nwee ha na-eji ndị a ma ama bekee kpọrọ celebrities ekwu maka i he ha na-eme, gịnị ka ị nọ eme, biko tido nna m.

N'aka nke ọzọ, Gbolahan Olojede bụ onye ọzọ okwu gbasara ego na akụnaụba doro anya, kwuru na ụlọọrụ ọbụla na-agwa ndị mmadụ tinye ego nke bekee kpọrọ 'investment scheme' mana aha ha adịghị n'akwụkwọ ụlọọrụ Securities and Exchange Commission (SEC), ụlọọrụ dị etu a bụ ponzi.

O kọwara na SEC bụ ụlọọrụ gọọmenti na-ahụ maka ụlọọrụ ndị na-eme ihe ọbụla gbasara itinye ego.

Nke abụọ, ọ sịrị na ọ bụrụ na ụlọọrụ ọbụla gwa gị ka i tinye ego gị ka ha chekwaara gị ya, na ụlọọrụ dị etu ahụ kwesiri inwe nkwado Ụlọakụ Etiti Naịjirịa bụ Central Bank of Nigeria n'olu bekee.

Ọ bụrụ na aha ha adịghị n'akwụkwọ CBN, nke a gosiri na ha bụ ponzi.

E jikwa ịkọ ogoloko akụkọ ifo mara ụlọọrụ ponzi.

Ọ bụrụ na ị nụ maka ụlọọrụ ọbụla kwere gị nkwa ime ka ego gị mụbawanye, ọ dị mkpa ka I lee anya ma mee nnyocha zuruoke iji chọpụta ka ha abụ ndị chọrọ igwu gị chandum.