Ha kwụrụ m puku naịra atọ oge m na-amalite ime ejije ọhụrụ- Kanaga
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Chinonso Orji Nnachi
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Kalu Anaga Emmanuel Emeh a maara nke ọma dịka Kanaga akọwaala etu njem ya siri malite dịka onye na-eme ejije.
Nwaokoroọbịa ahụ kpughere nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche.
Kanaga sịrị na mgbe ya malitere ime ejije ọhụrụ, na ego ndị a kwụrụ ya n'oge ahụ amasịghị ya.
"Ego m nara otu mgbe na-amasịghị m, mana o nweghị ihe m maara m ga-eme bụ puku naịra atọ".
"Emere m ejije ihe ruru otu izuụka, onye nhazi ejije enye m puku naịra atọ, sị m deere ya akara ọbaego m n'akwụkwọ na ọ ga-akwụ m ụgwọ n'izuụka nke na-abịa abịa. Mana ruo taa, o nwebeghị ihe m hụrụ," ka o kwuru.
Gbasara onye ọ na-elekwasị anya na Nollywood, Kanaga sịrị: "Na Nollywood, onye m na-elekwasị anya bụ Timini Egbuson. Ọ bụ ezigbo onye ejije. Ọ bụ ya ka m na-elekwasị anya ọbụladị tupu m banye na Big Brother. Ọ ma ihe ọ na-eme. Gị hụ mụ na ya, anyị na-akpa otu ụdịrị agwa. Ọ bụ onye m na-ahụ, m kpọọ ya nwanne m nwoke nke ukwu."
Kanaga kwuru na ọ ga-amasị ya ka ya na Uche Montana mekọọ ejije, ma sịkwa na onye ọ kachasị hụ n'anya oge ọ gara ihe omume Big Brother bụ Blue Aiva.
Oge a jụrụ ya maka ihe nkiri ya na Soso mere, nke ha jiri nweta ihe nrita AMVCA, Kanaga gwara anyị na ihe nkiri ahụ bụ nke ha jiri gbasaa ozi gbasara mmegbu nke ezinaụlọ.
"N'ezinaụlọ m si na ya pụta, nne na nna m hụrụ onwe ha n'anya, mana o nwere ụfọdụ mmadụ na-ahụtụbeghị ụdị ịhụnanya ahụ. N'ụwa anyị nọ n'ime ya taa, ọtụtụ ụmụnwaanyị na-agabiga mmegbu nke ezinaụlọ".
"Oge mụ na Soso kwuru na anyị chọrọ ime ihe nkiri ahụ, agwara m ya na ọ ga-amasị m ime ya, maka na ọ ga-emepe ndị mmadụ anya ka ha mata na ọ dịghị mma ka ụmụnwoke na-eti ụmụnwaanyị ihe".
"Ọ bụ ụzọ m chọrọ iji gbasaa ozi ahụ site n'olu m nakwa akaọrụ m. Ụmụnwaanyị biko, ọ bụrụ na nwoke ụnụ na ya mekọrọ ihe malite iti ụnụ ihe, hapụnụ ya. Ọ bụghị ịhụnanya. Ọ ga-ebutere gị mmerụahụ na ọnwụ."
Kanaga bụ nwaafọ Ọhafịa dị n'Abịa. Ọ gụrụ ụlọakwụkwọ sekọndịrị na Air Force Comprehensive School tupu ọ gaa ụlọakwụkwọ dị elu na PEFTI Film Institute maka ihe ọmụmụ Film and Television Production ma gụọ Photography na Videography.
Ejije mbụ o mere bụ Jenifa's Diary n'afọ 2021 tupu o mee My Flatmates. O mekwaala ọtụtụ ejije ndị ọzọ gụnyere MTV Shuga, Summer Rain, Us nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.



