INEC ekwuola ihe ha ga-eji akụrụngwa Ai mee na ntuliaka 2027

Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Joash Amupitan
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola ihe ha ga-eji akụrụngwa Ai mee na ntuliaka Nigeria n'afọ 2027.

INEC mere ka a mata nke a n'ọgbakọ ndị isi ntaakụkọ bụ All Nigeria Editors Conference (ANEC) mere n'Enugu steeti nsonso a.

Chukwuemeka Chukwu bụ onye nọchịtere anya onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Joash Amupitan n'ọgbakọ ahụ kwuru na INEC eguzobela ngalaba na-ahụ maka Ai n'ụlọọrụ ha.

Chukwuemeka Chukwu sị na INEC ga-eji akụrụngwa Ai rụọ ọrụ n'usoro na-ahụ maka mppọụta mpụtara ntuliaka bekee kpọrọ 'Results Management process'.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ mmadụ ga-agbaziri Ai ihe ọ ga na-eme.

Chukwu kọwara na nke a dị n'usoro ụlọrọ INEC hiwere maka iji akụrụngwa Ai arụ ọrụ.

Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Joash Amupitan

Ndụmọdụ INEC nyere ụlọọrụ mgbasaozi

Onyeisi ụlọọrụ INEC dọrọ aka na ntị maka egwu na-akụrụngwa Ai nwereike ibute ọnọdụ egwu na ntuliaka Nigeria ga-eme n'afọ 2027.

Chukwu gwara ndị ntaakụkọ ka ha guzube usoro ịchọpụta mgbe e ji Ai ekesa akụkọ ụgha.

Ọ kọwara na ugbua a na-eji Ai emepụta ọnụ okwu mmadụ, vidiyo mmadụ na-abụghị eziokwu ma kesaa ya ebe niile.

Ọ sị "ndị mmadụ nwereike iwepụta mpụtara ntuliaka abụghị eziokwu ma jiri Ai rụọ onye yiri onye ọrụ INEC.

Ọ kwuru na udiri ihe ahụ nwereike ibute ọgbaaghara.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ ka ha guzobe ngalaba n'ụlọọrụ mgbasa ozi ha ga-enyereaka tulee na akụkọ ọbụla ọ bụ eziokwu tupuu ha agbasaa ya.

Ọ dọrọ ụlọọrụ mgbasaozi aka na ntị maka igbasa akụkọ mpụtara ntuliaka mgbe a ka nọ na-agụkọ vootu ma kwuo na i buru INEC ụzọ kpọpụta mpụtara ntuliaka nwereike ibute nnukwu ọgbaaghara.

Akụkọ ozi ụlọọrụ INEC

Mana onyeisi Nigerian Guild of Editors bụ Eze Anaba mere ka a mat ana ọrụ ndị ntaakụkọ bụ ime ka ndị n'ọkwa na-eme ihe ha kwesiri ma na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya.