Adeniyi Adeyemi: Pati ndị anọghị na gọọmentị agbarụọla ihu dịka Tinubu nyere ICPC iwu ka ha nyocha PFIPC

Ebe foto si, Adeniyi Adeyemi
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-agba gọọmenti ukwu ajụla atụmatụ Onyeisiala Bola Tinubu nyere ka 'Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission' (ICPC) nyochaa ebubo metụtara ụlọọrụ a sị na ọ bụ nke adịgboroja a a kpọrọ, 'Presidential Foreign Intervention Promotion Council' (PFIPC).
Nkatọ a sochiri ntuziaka nke Tinubu nyere ICPC ka ha nyochaa ọrụ PFIPC, nke Adeniyi Adeyemi na-edu, ma nyefee mputara ya n'ime ụbọchị iri atọ.
Dịka ozi ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga, binyere aka si kwuo,nnyocha ahụ ga-elekwasị anya n'ebubo imepụta akwụkwọ adịgboroja, mgbalị ịchọ, akpaego ụlọakụ, azụmahịa ego na ndịọrụ gọọmenti maọbụ ndị ọzọ sonyere.
Ihe pati ndị na anghị n'ọchịchị na-ekwu

Ebe foto si, Omoleye Sowere/Facebook
Mana Ọnụ na-ekwuru African Democratic Congress (ADC) bụ Bolaji Abdullahi, na onye ndọrọndọrọ ọchịchị Omoyele Sowore nke Africa Action Congress (AAC) kwuru na gọọmenti etiti agaghị enwe ike ime nyocha n'ụzọ ziri ezi n'ihe metụtara ebubo e boro ya.
N'ozi o weputara na ụbọchi Wenezde, Bolaji kwuru na ụlọọrụ Onyeisiala eburula ụzọ kpee ikpe site n'ịkọwa akwụkwọ ndị metụtara okwu ahụ dịka akwụkwọ adịgboroja tupu nyocha amalite.
N'otu aka ahụ, Sowore sikwa na onweghi ntụkwasị obi ebe nyocha ICPC nọ.
Ha abụọ kwuru na naanị kọmitii nọọrọ onwe ha nwere ike ịchọpụta eziokwu ma weghachite ntụkwasị obi ọha.
Ọgbaghara ahụ gbadoro ụkwụ na nkwupụta Adeyemi na-ekwu na a họpụtara ya n'ụzọ iwu kwadoro dịka Onyeisi PFIPC.
Ọ boro Onyeisi ndịọrụ Onyeisiala bụ Femi Gbajabiamila, ebubo iri ngari n'ihi nhọpụta ahụ, ma jụkwa nkwupụta gọọmenti na ụlọọrụ PFIPC adịghị.
Ma ụlọọrụ Onyeisiala kọwara Adeyemi dịka onye aghụghọ, na-ekwu na o mepụtara akwụkwọ nhọpụta adịgboroja jiri ya kpọọ onye ọrụ gọọmenti n'ụlọọrụ na-adịghị adị.
Ka ọ dị ugbu a, e boro Adeyemi na mmadụ abụọ ọzọ ebubo mpụ asatọ n'ụlọikpe, ebe a ga-amalite ikpe ahụ na 27 Julaị.
Cheta n'otu pati Nigeria Democratic Congress, NDC kpọrọ oku ka a chụpụ Gbajabiamila ozugbo, maka ebubo gbasara ya na ụlọọrụ gọọmentị a na-enyo enyo nakwa okwu ịre ọkwa ọrụ gọọmentị.
N'ozi ọnụ na-ekwuru NDC bụ Osa Director wepụtara na Fraịde, abalị atọ nke ọnwa Julaị, otu pati ahụ rịọrọ Onyeisiala Tinubu ka ọ kwụsị Onyeisi Ndị Ọrụ ya n'ọrụ nwa oge, iji nye ohere maka nnyocha doro anya n'ihu n'ebubo ndị ahụ.



























