E bidola ikpe ndị e jidere maka ọnwụ Godwin Adimike bụ onye ọchụnta ego e gburu n'Abuja

Ebe foto si, Nigeria police
A malitela ikpe mmadụ atọ ikpe maka ọnwụ Godwin Adimike bụ onye ọchụnta ego e gburu n'Abuja.
Mmadụ atọ ndị a na-ekpe ikpe bụ Adimike Anthony, Adimike Stephany na Comfort Ajibade.
Mana Anthony na Stepany bụ ụmụaka Godwin Adimike, ebe anyị amabeghị onye Comfort Ajibade bụ nakwa mmekọ ya na ezinaụlọahụ.
Etu os i dị ugbua, ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka a kpọchie ha atọ n'ụlọ mkpọrọ Suleja maka ebubo igbu nna ha bụ Godwin Adimike.
Onye bụ Godwin Adimike?
Godwin Adimike bụ nnukwu onye ji ego achụ nta ego a maama n'isi opbodo Naịjirịa bụ Abuja.
A makwaara ya dịka Egonaejeije n'Awka-Etiti, Anambara Steeti.
Ọ di afọ iri ise na ọtọ (53).
Ọ bụkwa onye ọchụnta ego a ma ama n'ahịa Alaba International dị na Lagos.
A makwaara ya maka azụmahịa eletrọnik na ọrụ ebere nke gụnyere ịkwado agụmụakwụkwọ ọtụtụ ndị ụkọchukwu Katọlik.

Ebe foto si, Nigeria Police
Etu e si gbuo Godwin Adimike?
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nke FCT bụ Josephine Adeh, kwuru na e gburu Godwin Adimike na Mee 15, 2026 n'ụlọ ya dị na Guzape, Abuja.
Ọ sị na mgbe a kpọrọ ndị uweojii ka ha bịa lelee ihe mere n'ụlọ Godwin Adimike ka ha hụrụ ajọ ọnọdụ ọ nọ na ya mgbe ha rutere.
Ọ sị na ha hụrụ ọtụtụ ọnyá mma e ji gbukasịrị ya ahụ.
Ọ kwuru na a kpọgara ya n'ụlọogwụ Karu General Hospital, ebe ndị dọkịnta kwupụtara na ọ nwụọla.
Adeh kwuru na Kọmishọna ndị Uweojii FCT bụ Ahmed Muhammed Sanusi nyere iwu ka e mee nyocha zuru ezu, nke mere ka ejide mmadụ ise, gụnyere ụmụ Adimike abụọ, onye ọkwọ ụgbọala ya na onye nche ụlọ ya.
Mana mgbe nnyocha gwụchara, naanị Anthony, Stephany na Comfort Ajibade ka a kpụgara ụlọikpe ma hapụ onye ọkwọụgbọala na onye nche ụlọ Adimike.
Ebubo a na-ebo ụmụ Godwin Adimike na otu nwaanyị ọzọ
Ndị uweojii FCT na-ebo ụmụ Godwin Adimike abụọ nakwa otu nwaanyị ọzọ ebubo igbu mmadụ.
Ebubo ọzọ bụ ịkpa nkata igbu ọchụ.
Ọzọ bụ ị da iwu na-egbochi alụmdi na nwunye n'etiti nwoke na nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị.
Mana ụlọikpe yigharịrị ikpe ahụ ruo Sepụtemba 30, 2026.
Ụlọikpe nyere iwu ka e debe mmadụ atọ ahụ a na-enyo enyo n'ụlọ mkpọrọ ruo mgbe a ga-anụ ikpe ha ọzọ.


























