Ndị obodo Esinele Oyo Steeti kọwara ihe ha hụrụ mgbe ndị ekperima wakporo ụlọakwụkwọ dị n'obodo ha

Aha onyonyo, Etu ndị ekperima si wakpọọ ụlọakwụkwọ n'obodo Eshinele dị n'Oyo Steeti
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

N'izuụka gara aga, ndị ojiegbe wakporo ụlọakwụkwọ abụọ dị n'obodo Esinele na Yawota dị n'okpuru ọchịchị Oriri Oyo steeti.

BBC News gara obodo ahụ iji chọpụta etu ọnọdụ dị kemgbe mwakpo ahụ mere.

Anyị chọpụtara na oke egwu ji ụfọdụ ndị ka nọ n'obodo ahụ n'agbanyeghị na ha kwuru na ndịagha na ndị ọrụ nchekwa batara obodo ahụ kara ha obi, Ndịagha ahụ nọ n'obodo ahụ iji weta nchekwa ma rụọ ọrụ iji hụ na ndị ahụ a tọrọ nweere onwe ha.

Onyeisi obodo ahụ gwara BBC News na ha na-eme ọgbakọ nchkewa obodo oge ndị ojiegbe ahụ wakporo obodo ha.

Aha m bụ High Chief Tajudeen Abioye, Eleshinle ti ilu nke okpuru ọchịchị Esin Ele ni Orire

"Ajọ ọdachi a gbawara anyị niile obi, ihe di etu a na-eme n'obodo Yawota gbara anyị gburugburu n'oge gara aga.

"Oge ihe ahụ mere n'ụbọchị Fraịde, anyị na-enwe ọgbakọ iji kpaa etu anyị ga-eji chekwaa obodo anyị oge anyị nụrụ ụda egbe na-ada ka ka ka, tupu anyị amara ihe na-eme, ha atọrọla ụmụaka ahụ.

Anyị kpọtụụrụ ndị ọrụ nchekwa ndị nyeere anyị aka ngwa ngwa, oge ndịagha wuchiri okeala ahụ, ụgbọala onyeisi ụlọakwụkwọ na ọgbaatumtum ndị ntọ ahụ

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

"ha ji buru ndị ahụ banye n'ime ọhịa tọgbọrọ na nkịtị, ha mụnyere ụgbọala onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ ọkụ ma kpọrọ ndị ha tọọrọ banye n'ime ọhịa.

Ndị ọrụ ochekwa na-agba mbọ kemgba abalị gara aga, ha na-eme nnyocha n'ime ọhịa anyị, ọtụtụ ndịagha ruru 400 nọ ebe a, ndị uweojii nakwa ndị ọzọ.

"Onyeisi ndị uweojii, Kọmishọna ndị uweoji Oyo steeti na Ilorin bịara ebe, osote onyeisi ndị uweoji nọkwa ebe a."

Otu onye ọzọ bụ onye dinta n'obodo ahụ kwuru na;

"Aha m bụ Adewale Olaniyi si obodo Eshin ele dị n'Oyo Steeti. Anyị naenwe ọgbakọ oge anyị malitere ụda egbe, anyị biliri ọtọ maka na ụdịrị ihe a emeela.

"Tupu anyị erute n ụlọakwụkwọ praịmarị ahụ, ha egbuola otu onye nkụzi. Anyị kelere Chukwu, anyị gbara mbọ, ha gbara anyị egbe, anyị gbakwara ha egbe mana ọ tụghị ha.

"Tupu anyị eruo ụlọakwụkwọ sekọndrị ahụ, ha kpọọrọ ụmụaka ahụ, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ na ndị nkụzi ise.

"Anyị na-enye ndị gọọmenti zutere anyị ihe maka na ha nwetere udo n'obodo anyị maka na njiji kara iji ma ọ bụrụ na ọ bụghị maka ha.

"Anyị na-arịọ Chukwu ka o chekwaa ndụ anyị na ndụ ụmụ anyị ha tọọrọ, ndị nkụzi ụlọakwụkwọ ahụ ka ha lọghachite n'udo."

E gburu otu n'ime ndị nkuzi a tọrọ n'ụlọakwụkwọ - Gọvanọ Oyo steeti

Akụkọ ụlọmgbasa ozi mpaghara na-ekwu na a tọọrọ opekatampe, ụmụaka ruru iri anọ na ise na ndị nkuzi site na ụlọakwụkwọ atọ dị iche iche.

Ebe foto si, Gov. Seyi Makinde

Aka na-achị Oyo steeti ekwuola na ndị na-eyi ọha egwu egbola otu n'ime ndị nkuzi asaa a tọọrọ na steeti ahụ.

Seyi Makinde kwuru na a tọọrọ ndị nkuzi asaa n'ụlọakwụkwọ atọ dị na okpuruọchịchị Oriire n'ụbọchị Fraịde gara aga.

O kwuru na e gburu onye nkuzi nke e kwuru na ọ bụ mgbakọ na mwepụ ka ọ na-akụzi.

Ka ọ dị ugbu a, ndị uweojii na ndị ọchịchị steeti kwuru na ha ka na-agbalị ịchọpụta kpọmkwem ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ na-efu efu.

Mana akụkọ ụlọmgbasa ozi mpaghara na-ekwu na a tọọrọ opekatampe, ụmụaka ruru iri anọ na ise.

Gọvanọ kwuru na ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa na-azaghachi ndị ahụ na-eyi ọha egwu mgbe ha na-eme mwakpo ahụ merụkwara ahụ.

"Ndịagha, ndị dinta na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ merụrụ ahụ na-agbake nke ọma," ka o kwuru.

Makinde kwuru na steeti ya guzobere ihe ọ kpọrọ "otu nzaghachi mpụ ime ihe ike" na mmekọrịta ya na ndị uweojii.

Cheta na ọ bụ ụbọchị Sọnde 17 Mee 2026, ka onyonyoo na-efegharị n'ịntanetị gosiri ụmụnwaanyị na-ekwu na ha so n'ime ndị a tọọrọ ma na-arịọ maka enyemaka.

Mana ndị uweojii kwuru na ha na-enyocha eziokwu dị n'ihe nkiri ahụ ma dọọ ọhanaeze aka na ntị ka ha ghara ikesa ozi a na-emeghị enyocha nke nwere ike ime ka ụjọ jide ndị mmadụ.

Ọzọ, o nwebeghị otu kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ.

Ka ọ dị ugbu a, e mechiri ụlọakwụkwọ dị na mpaghara ndị ihe ọjọọ metụtara na mbụ, mana gọọmenti steeti ahụ mechara nye iwu ka ha mepee ụlọakwụkọ ndị ahụ n'ụbọchị Mọnde mgbe e tinyere ndị ọrụ nchekwa ọzọ.

Ndị nchekwa amalitela ịchọ ụmụaka 50 ndị ojiegbe tọọrọ na Mussa, Borno steeti

E nweela ọtụtụ ndị mmadụ e ji ngwa agha tọọrọ na mpaghara ugwu na etiti Naịjirịa n'afọ ndị na-adịbeghị anya, nke ndị omekome na ndị Islamist mere.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

N'aka nke ọzọ, ndị ọchịchị Borno steeti ezigala ndị nche obodo na ndị nchekwa iji chọta ụmụaka ruru ihe dịka iri ise nke ndị ojiegbe tọọrọ n'ụlọakwụkwọ dị na Mussa.

Onyeisioche nke okpuruọchịchị Askira Uba nke ya na ogbo ya si Chibok gara obodo Mussa n'ụbọchị Sọnde 17 Mee iji tie ndị nne na nna nke ụmụaka a tọọrọ aka n'obi ma kwe nkwa ime ihe niile ha nwereike ime iji hụ na a tọhapụrụ ha ma kpọghachite ha n'ụlọ.

Ọ gwara ndị nne na nna na otu ndị nche nd ndịagha ga-arụkọ ọrụ iji chọpụta ebe ndị tọọrọ ahụ nọ.

Ka ọ dị ugbu a, otu nne na nna agwara BBC na ụmụaka abụọ n'ime ụmụakwụkwọ a tọọrọ agbapụla n'aka ndị jidere ha ma laghachi n'ezinaụlọ ha.

Cheta na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu jihadist wakporo ụlọakwụkwọ atọ dị na Mussa n'ụbọchị Fraịde 15 Mee 2026, na-agba egbe iji mee ka ụjọ jide ha tupu ha chịkọta ụfọdụ ụmụakwụkwọ wee buru ha n'ụgbọ ọgbatumtum.

E kwukwara na ọtụtụ n'ime ụmụaka ahụ bụ obere ụmụaka dị n'agbata afọ abụọ na ise, si Mussa Central Primary School nke nwere ụlọakwụkwọ ọta akara na ngalaba praịmarị.

Ndị hụrụ ihe merenụ n'ụtụtụ Fraịde na Mussa, Borno steeti, kwuru na ndị a na-enyo enyo ji ụmụaka ahụ kpochie onwe ha mgbe ha na-agba ọsọ n'ụgbọ ọgbatumtum nke na-egbochi ndị nchekwa ịgba ha egbe.

Ka ọ dị ugbu a, o nwebeghị otu kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ.

Ntọrọ ndị a mere n'ụlọakwụkwọ sekọndrị nke gọọmenti nwe bụ Government Day Secondary School, ụlọakwụkwọ praịmarị Mussa Central Primary School, na ụlọakwụkwọ sekọndrị nke State Universal Basis Education Board (SUBEB).

Kedụ etu ntọrị Oyo na Borno steeti si yie?

*Ha abụọ mere n'otu ụbọchị Fraịde 15 Mee 2026.

* Ndị ojiegbe ahụ wakpọrọ ụlọakwụkwọ ruru atọ n'otu okpuruọchịchị.

* Ọ bụ ụmụakwụkwọ iri ise ka a tọrọ na Borno steeti ebe ihe ruru ụmụakwụkwọ iri anọ na ise ka a tọrọ n'Oyo steeti.