You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Odira Nwobu: A malitela emume olili ozu ya n'obodo ya dị n'Anambra Steeti
Ndị enyi, ikwu na ib na ndị nkwado, ga-anọ taa bụ Satọde 11 Eprel, 2026 kwanyere Odira Nwobu ugwu ikpeazụ tupu e lie ya na be nna ya dị n'obodo Umubelle, dị n'okpuru ọchịchị Awka n'Ananbra Steeti.
Akụkọ kwuru na Odira so ndị ụlọọrụ ọ na-anọchiteanya anya ha bụ Nwaguatahihia Properties & Homes Ltd mee njem na mba Saụt Afrịka iji gbasaa oziọma ụlọọrụ ahụ nye ọtụtụ mmadụ.
Akụkọ kwuru na Odira nwụrụ n'elu nwaanyị n'ụlọ oriri na nkwari dị na mba Saụt Afrịka malitere ifegharị ngwa ozi banyere ọnwụ ya gbara n'anwụ.
Mana Ọkaiwu Chukwujekwu Chukwudi na-anọchiteanya ụlọọrụ Nwaguatahihia Properties & Homes Ltd, gwara BBC News Igbo kpọm kwem na Odira Nwobu anwụghị n'elu nwaanyị maọbụ site n'ọgwụ na-enyere aka na mmekọ nwoke na nwaanyị ma gwa BBC na a ga-eme nnyocha autopsy iji chọpụta ihe gburu Odira.
E buletara ozu Odira Nwobu na Naịjirịa n'ụbọchị Tuzde Disemba 16, 2025.
Ihe i kwesiri ịma maka Odira Nwobu
- A mụrụ Odira Nwobu n'ọnwa Mee 24, 1990, n'Enugwu Steeti.
- Ọ bụ onye obodo Umubelle dị n'okpuru ọchịchị Awka Saụt, Anambra Steet.
- Ọ malitere ime ejije ngwangwa ọ gụchara akwụkwọ Sekọndrị. Ejije mbụ o mere bụ 'Joseph the Dreamer'. Ọ gaala n'ihu mee ejije ruru 60 nke gụnyere Goat Lover nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. A maara ya dịka onye ejije ya na-atọ ọchị nke ukwuu.
- N'ọnwa Jụlaị 2025, Odira nwere ihe mberede okporoụzọ nke mere ka ọtụtụ mmadụ malite ikwu na ọ nwụọla.
- Ọtụtụ ndị otu ya na-eme ejije na ndị enyi ya gụnyere Dike Osinachi a maara dịka Apama, Odunze Anthony onye e ji Rolex maara kọwara ya dịka onye nwere obi umeala dịka ha na-ezitara ezinaụlọ ya ozi iti aka n'obi.
- Ọ nwụrụ n'ụbọchị Mọnde 24 Nọvemba, 2025 na mba Saụt Afrịka.