Holy Thursday: Ihe Tọzde dị nsọ pụtara nakwa ka e siri mee emume a n'Enugwu

Mmemme Holy Thursday na Holy Ghost Cathedral Enugwu.
Nkọwa foto, Ụka Holy Thursday na Holy Ghost Cathedral Ogui Enugwu. Bishop ụka katọliki bụ Callistus Onaga nọ n’isi nchụ aja.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụbọchị 2 Eprel 2026 bụ ụbọchị e mere emume Tọzde dị nsọ n'ụwa niile.

Ndị otu Kraịst nọ na ya bụ emume ugbua.

Mana gịnị bụ ụbọchị Holy Thursday?

Holy Thursday bụ Tọzde dị nsọ bụ ụbọchi ga-efota ụbọchi akpọgidere Jizọs n'obe.

Iji cheta ụbọchi a, ndị ụka dị iche iche mere emume nke ha.

Mmanụ ndị ọria, mmanụ echichi, na mmanụ ndị ọzọ.
Nkọwa foto, Mmanụ Chrism a na-agọzi ụbọchị Holy tozde

Na Holy ghost Cathedral Ogui Enugwu, Bishop nke Enugwu diocese bụ Callistus Onaga kpọrọ oku ka ndị otu Kraịst nyere ibe ha aka n'oge lent.

Ndị Fada karịrị narị atọ, ụmụ nwaanyị chiri echichi na ndị nkịtị gbakọrọ maka ya bụ ụka.

Ngwa ngwa a kachara ụka, Onaga gọziri mmanụ Chrism wee gwa ndị e chirị echichi ka ha bịa gbara mmanụ nke ha laa na parish ha dị iche iche were ya rụọ ọrụ.

Mmemme Holy tozdee nke Anglican church, ha kpọrọ ya “Maundy Thursday”
Nkọwa foto, Ndị ụka Anglican na mmemme Holy Thursday emere na Cathedral church of good shephard Enugwu taata

Ndị e chiri echichi dịka ndị Fada na-ekwegharịkwa nkwa ha na ụka Katọlik. Na mgbede ụbọchi Holy Tọzde ka mmemme isa ụkwụ na-eme. Onye ụkọchukwu na-asa dimkpa iri na abụọ ụkwụ iji ṅomie ihe Jizọs mere n'abalị a raara ya nye n'aka ndị iro.

Ụkọchukwu n’asa mmadụ iri na abụọ ụkwụ ha iji mee ncheta ka Jeso si saa ụmụ azụ ya ụkwụ.

Ebe foto si, Mmemme isa ụkwụ ụbọchị Holy Thursday.

Na ụka Anglịkan nke Cathedral Church of Good Shephard, Bishop Samuel Obiajuru Ike kaara ndị ụkọchukwu ya niile ụka wee gwa ha ka ha na-akpa agwa ka Jizọs bụ onye a na-eso ụzọ ya.

Ka ụka ahụ gachara, Bishop Samuel Obiajuru Ike sara mmadụ iri na abụọ ụkwụ ha.

Mmemme ịsa ụkwụ ga-akpọtụ n'ụka mgbede na nke ndị Katọlik.

E nwekwara mmemme dị iche iche maka ndịagha ahụ biara kpụrụ Jizọs.