Kedụ etu Ụka Katọlik, Metọdist na Anglịkan si eme emume 'lent'?
Emume 'lent' bụ oge dị oke mkpa nye ndị ụka kraịst ọkachasị ndị ụka Katọlik, Anglịkan, Methọdist nakwa ụka Presbyterian.
Ọ bụ oge ndị ụka ji ebu ọnụ ruo abalị iri anọ iji cheta oge ọwụwa, ọnwụ nakwa mbilite n'ọnwụ Jisọs Kraịst.
Ọtụtụ mmemme a na-eme n'oge gụnyere 'Ash Wednesday' bụ oge e ji egbu ntụ, 'Holy Thursday' bụ oge e ji echeta oriri ikpeazụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya riri ma bụrụkwa oge Jisọs sara ndị na-eso ụzọ ụkwụ.
Emume ọzọ bụ 'Good Friday' bụ oge e ji echeta ọnwụ Jisọs Kraịst ebe emume 'Easter Sunday' bụ ụbọchị e ji echeta mbilite n'ọnwụ Jisọs Kraịst.
Ọtụtụ mmadụ ajụọla kedụ ihe dị iche n'etu ụlọụka Katọlik, Anglịkan, Methọdist nakwa ụka Presbyterian si emerube emume lent.
Anyị chọpụtara ọtụtụ ihe dị iche iche n'etu ụlọụka ndị a si eme emume lent.
Banyere Ụka Methodist na Ụka Anglịkan, anyị jụrụ Ụkọchukwu Chibueze Nmesirionye ji ọkwa dịka Chaplain nke Bishọpụ Christopher Edeh bụ Bishọpụ Dayọsis Ụka Methodist Enugwu steeti, gwara anyị na enwechaghị ihe dị iche n'etu ụka Anglịkan na Methọdist si eme ihe n'oge lent.
Mana ọtụtụ ihe dị iche dị n'etu ụka Katọlik si eme emume lent.
Ụfọdụ ihe ndị ha na-eme gụnyere 'station of the cross' nakwa ụfọdụ ihe ndị ọzọ nke anyị kọwara n'ime akụkọ a.



