Ọ bụ eziokwu na VDM ji AI mee vidio maka Onyeisiala Tinubu?

Aha onyonyo, Ọ bụ eziokwu na VDM ji AI mee vidio maka Onyeisiala Tinubu?
Ọ bụ eziokwu na VDM ji AI mee vidio maka Onyeisiala Tinubu?
Mgbe e biputara ya

Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Bola Tinubu bụ Bayo Onanuga akpọọla oku ka e nye Martin Vincent Otse a maara dịka Very Dark Man (VDM) ntaramahụrụ dịka iwu si kwuo maka ebubo ikesa okwu ụgha banyere Onyeisiala Tinubu na soshal midia.

Bayo Onanuga kpọrọ oku a n'ụbọchị Wenezde abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee, 2026, oge ọ na-azaghachi akara X wepụtara ihe onyonyo a sị Very Dark Man wepụtara.

Mana ọ bụ eziokwu na VDM mere ihe onyonyo a sị o mere?

Nchọpụta anyị mere gosiri na mmadụ ji akụrụngwa AI rụọ onyonyo nke VDM wepụtaburu n'ụbọchị Mọnde, abali iri abụọ na ise nke ọnwa Mee, 2026.

Na vidio nke VDM wepụtara, ọ bụ onye a na-akpọ King Mitchy ka VDM na-ekwu maka iheolu o yi ma.

VDM gosikwara ihe onyony ebe Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ bụrụ na ọchịchị ya enyeghị ndị Naịjirịa ọkụ latrik n'afọ anọ, ha ghara ịtụrụ ya vootu ma ọ bịa ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ.

Mana onye amabeghị onye ọ bụ weere ihe onyonyo VDM ahụ , gbubie ya ebe o kwuru'lee ihe onyonyo ihe onyeisiala kwuru' mana ka itinye ihe onyonyo, e tinye olu dịka nke Onyeisiala Tinubu nke na-ebo ebubo dị iche iche nke gunyere na y a kpọrọ Onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha out NDC bụ Peter Obi ka ọ hapụ ịzọ ọkwa onyeisiala.

Ọnanuga ekwuola n'olu ahụ bụ nke adịgboroja, ọ bụghị nke onyeisiala ebe ndị maara ihe ekwe na-akụ banyere akụrụngwa AI, ekwuola na iji akụrụngwa AI rụpụta okwu ọnụ, vidio maọbụ edemede dị etu a, nwere ike itinye ọgbaghara n'obodo.

Na nzaghachi o wepụtara n'akara Instagram ya, VDM katọrọ ebubo ahụ Onanuga boro ya ma kwuo na nke a gosiri na Onanuga anaghị eche uche ọfụma.

Ọ gara n'ihu kwuo na ya agaghị ekwu ka ọ bụ ya mere vidio ahụ ka ọ na ọbụghị kama na ọ dị mkpa ka ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu lebanye anya na nsogbu na-echere Naịjirịa aka mgba gụnyere ajọ ọnọdụ nchekwa, enweghị ọkụ latrik nakwa ndị dị ka ibe ya.