Etu mmadụ 20 si nwụọ ebe a na-azọ otite mmanụ nsọ

Karama mmanụ olive

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Ihe ruru mmadụ iri abụọ nwụrụ ebe iri na isii merụrụ ahụ n'ụbọchị Satọde 1, Febụwarị 2020 n'oge ofufe Kraịst n'ogboegwuregwu dị na mpaghara ugwu Tanzanịa.

Ndị a nwuru ebe ha na-azọ onye ga-ebu ụzọ nata otite mmanụ nsọ a kpọrọ "Blessed oil" dịka onye ọrụ gọọmentị si kwuo.

Nke a mere mgbe onyeisi nchụaja bụ Pastọ Boniface Mwamposa nke ụlọụka 'Arise and Shine Ministry Tanzania' wụpụrụ mmanụ ọ kpọrọ mmanụ nsọ n'ala.

Mmanụ a nke ọ sị ga-agwọ imirikitimi ọrịa, mere igwe mmadụ jiri sọkọta isi na-azọ onye ga-ebuzọ rụrụ mmanụ nsọ a.

Igwe mmadụ a ji ụkwụ zọgbuo mmadụ iri abụọ n'ime ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

Anya hụrụ ka o si mee gwara ndị ntaakụkọ AFP na ọ dịka ebe a tụpụrụ nkịta ọkpụkpụ n'ala.

Ọ sị na ndị mmadụ zọrọ onwe ha ụkwụ na-enweghi obi ebere, na e nwekwara ndị ji mpi aka na-akpọ onwe ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: