Igbo Culture: Ihe mere e ji kwụsị ịgba mbarị n'obodo anyị

Aha onyonyo, Igbo Culture: Ihe mere e ji kwụsị ịgba mbarị n'obodo anyị
Mgbe e biputara ya

Ndị ichie obodo Imerienwe kọwara ihe mere ha esoghi ụkpụrụ ndị nna nna ha n'omenala ịgba mbarị.

Ha gwara BBC Igbo na mbarị bụ omenala ha zutere dịka a mụrụ ha, na onweghi onye dị ndụ ugbua nwereike ịkọwa mgbe ọ malitere.

Dịka e si kọrọ ha, ndị na-agba mbarị na-anọkọ otu ebe were ọmụ na akịrịka gbachie onwe ha ruo ihe ruru afọ abụọ.

Ndị a ga-amalite iji aja ụrọ na nzụ na-akpụ ụzụ dị iche iche n'ime afọ abụọ ha ga-anọ n'ime mbarị a.

Mgbe ha kpụchara, ha ga-agba ya n'anwụ ka ndị ọha nwee ike hụrụ ihe ha kpụrụ

Ha kwuru na ụfọdụ na-ahụta ya dịka agbara maka na ọ na-akụgbu onye mere ihe ọjọọ n'oge ahụ..

Ndi ichie kwuru na ọ bụ mgbe ụka Kraịst batara n'obodo, ka a kwụsịrị ịgba mbarị n'obodo ha ma were ya mere zie ebe nlereanya.

Ndị mepụtara ihe nkiri a bụ Ikechukwu Kalu na Vining Ogu