Super Eagles Squad: Ị ma ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles niile?

Mikel Obi
Nkọwa foto, John Mikel Nchekwube Obi bụ onye ndị otu Super Eagles. Otu egwu bọọlụ Trabzonspor nke dị na mba Turkey bụ ebe ọ nọzi ugbua. Ọ bụ onye Anambra Steeti.
Mgbe e biputara ya

Ndị otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles na-eme ụmụ Naijiria niile obioma n'asọmpi iko mba Afrịka nke afọ a.

Ha agafeela na agba abụọ nke ikpeazụ na ya bụ asọmpi ebe ha ga-ezute mba Ivory Coast maọbụ Algeria ụbọchị ụka, abali iri na anọ nke ọnwa Julaị.

Ị ma mmadụ ole so n'otu ndị Super Eagles? Ị ma aha ha na ebe ha na-agba bọọlụ?

Lee ya ebe a:

Ahmed Musa
Nkọwa foto, Ahmed Musa bụ nwa afọ Naijiria mbu nyere goolu abụọ na asọmpi iko mba ụwa. Ọ bụ onye Kano steeti. Ọ na-agbara ndị Al-Nassr nke Saudi Arabia.
Odion Ighalo
Nkọwa foto, Ighalo bụ mba China ka ọ nọ ugbua akpata ihe ọ na-eri. Ọ na-agbara ndị otu egwu bọọlụ Shanghai Greenland Shenhua. Ọ bụ onye Edo Steeti
William Troost Ekong
Nkọwa foto, William Troost-Ekong na-agbara ndị Udinese nke mba Italy. Nne ya bụ onye mba Netherlands ebe nna ya bu onye Akwa Ibom steeti.
Leon Balogun
Nkọwa foto, Balogun bụ onye Naijiria bụrụkwa onye Germany. Nna ya bụ onye Ijebu-Ode na Ogun steeti. Ọ na-agbara Brighton and Hoves Albion nke mba England.
Kenneth Omeruo
Nkọwa foto, Kenneth Omeruo bụ onye otu Chelsea nke England mana ọgbabeghi bọọlụ ebe ahụ ma otu. Chelsea na-ezipugharị ya na-enya otu egwu bọọlụ dị iche iche. Ọ bụ onye Abia.
Oghenekaro Etebo
Nkọwa foto, Oghenekaro Etebo na-agbaburu Warri Wolves nke Delta Steeti. Ebe ọ nọ ugbua bụ Stoke City nke mba England. Ọ bụ onye Delta steeti.
Alex Iwobi
Nkọwa foto, Alex Iwobi na-agbara Arsenal nke England bọọlụ. Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Jay Jay Okocha na Nne Iwobi bụ otu nne ji ha. Nna ya bụ onye Anambra ebe nne ya bụ onye Delta steeti.
Wilfred Ndidi
Nkọwa foto, Wilfred Ndidi bụ ịgba etiti (midfield) ka e ji mara ya. Ọ na-agbara otu Leicester City nke England. A mụrụ ya na Legos steetiu. Nna ya bụ onye agha.
John Ogu
Nkọwa foto, Ugochukwu John Ogu sonyere ndị otu Super Eagles n'afọ 2013. N'ọnwa Mee afọ a ka ọ hapụrụ otu Hapoel Be'er Sheva nke mba Israel. Amabeghi ebe ọ ga-aga ọzọ.
Chidozie Awaziem
Nkọwa foto, Chidozie Awaziem bụ onye Enugwu steeti. O na-agbara ndị FC Porto nke Portugal, mana e zipuru ya gaa Çaykur Rizespor.
Abdullahi Shehu
Nkọwa foto, Abdullahi Shehu bụ onye Kano steeti. Ọ na-agbara ndị Bursaspor nke mba Turkey. Ọ gbaburu Kano Pillars
Daniel Akpeyi
Nkọwa foto, Daniel Akpeyi bụ ochee goolu. Ọ bụ ndị Kaizer Chiefs nke South Afrịka ka ọ na-echere. Ọ bụ onye Nnewi na Anambra Steeti.
Samuel Kalu
Nkọwa foto, Samuel Kalu dị afọ 21. Ọ na-agbara Bourdeaux nke France. Ọ bụ onye Abia steeti.
Ola Aina
Nkọwa foto, Temitayo Olufisayo Olaoluwa (Ola Aina) na-agbara ndị Torino nke mba Italy bọọlụ. Ọ gbaarala ndị mba England n'ogogo 'Under 16, 17, 18, 19 na 20'
Jamilu Colins
Nkọwa foto, Jamilu Collins bụ onye Kaduna steeti. A mụrụ ya na 1994. Otu egwu bọọlụ ọ nọ na ya bụ SC Paderborn 07 nke Germany.
Moses Simon
Nkọwa foto, Moses Simon na-agba bọọlụ na Levante nke Spain. A mụrụ ya na Jos Naijiria n'afọ 1995
Henry Onyekuru
Nkọwa foto, Henry Onyekuru bụ onye Anambra. Ọ na-agbara ndị Galatasaray nke mba Turkey, mana ndị nwe ya bụ ndị Everton nke England.
Nigeria's Paul Onuachu
Nkọwa foto, Paul Onuachu na-agbara FC Midtjylland nke Denmark. A mụrụ ya n'afọ 1994 n'Owere dị n'Imo State
Samuel Chukwueze
Nkọwa foto, Samuel Chukwueze bụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua. Nwata nwoke a na-agbara ndị Villareal nke Spain. Ọ bụ onye Umuahia dị n'Abia steeti. Ọ gbara naanị afọ iri abụọ.
Uzoho na Ezenwa
Nkọwa foto, Francis Uzoho na Ikechukwu Ezenwa bụ ndị ochee bọọlụ Naijiria. Uzoho bụ onye Imo steeti nọ mba Spain, ebe Ezenwa na-echere ndị Katsina United.
Victor Osimhen
Nkọwa foto, Victor Osimhen bụ onye Edo State. Ọ na-agbara ndị Sporting Charleroi nke mba Belgium. Ọ dị afọ iri abụọ.

Akụkọ ga-amasị gi: