Prince Philip funeral: Foto etu Ezenwaanyị na ndị mba Briten si dulaa duke

Mgbe e biputara ya

Ezenwaanyị edurula ezinaụlọ ya - na mba Briten - n'ịkwa ozu di ya, Duke nke Edinburgh, na Windsor Castle.

Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ n'akwamozu Duke nke Edinburgh n'ụlọụka St George dị na Windsor Castle, Berkshire.

Ezenwaanyị nọ n'ihu oche, nke kacha nọ nso ọlta. Ọkparaeze nke Wales na Nwunye Ọkparaeze nke Cornwall nọ ya nso, ma nọsapụ anọsapụ.

Ka a na-ebuba akpatiozu n'ime ụlọụka St George dịka a na-eme akwamozu Ọkparaeze Philip nke Briten, nke nwụrụ ka ọ dị afọ 99, na Windsor Castle, Briten, Epreelụ 17, 2021.
Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ na-ele anya ka a na-ebukwasị akpatiozu nke Duke nke Edinburgh n'ụlọụka St George, Windsor Castle, Berkshire n'oge akwamozu ya.
1px transparent line
E bubara akpatiozu nke Duke nke Edinburgh nke e ji ọkọlọtọ ya kpuchie n'elu ụgbọala Land Rover a rụrụ maka ụdịrị ihe a, n'oge akwamozu Ọkparaeze Philip, na Windsor Castle n'ụbọchị 17 nke ọnwa Epreelụ, 2021

Akpatiozu nke duke na-aga Ụlọụka St George malitere njem ya dịka ndị na-ebu ya bulitere ya ebe a dọbara ya n'ime ọnụụlọ ma na-aga n'ebe mpụta ezi.

Mmadụ itoolu ndị ezinaụlọ Eze gụnyere ụmụ ya bụ Ọkparaeze Charles, Adaeze Anne, Ọkparaeze Edward nakwa Ọkparaeze Andrew so na-aga n'azụ akpati ozu ya.

Adaeze Anne, Adaeze ụlọeze, Ọkparaeze Charles, Ọkparaeze nke Wales, Ọkparaeze Andrew, Duke nke York, Ọkparaeze Edward, Earl nke Wessex, Ọkparaeze William, Duke nke Cambridge, Peter Phillips, Ọkparaeze Harry, Duke nke Sussex, Earl nke Snowdon David Armstrong-Jones nakwa Vice-Admiral Sir Timothy Laurence, so duru akpatiozu Ọkparaeze Philip, Duke nke Edinburgh dịka a na-eme emume akwamozu ya na Windsor Castle na 17 nke Epreelụ, 2021

Duke nke Cambridge na Ọkparaeze Harry nọ n'ahịrị nke atọ dịka nwa nwanne nna ha bụ Peter Phillips nọ ha n'etiti.

Ọkparaeze William, Duke nke Cambridge, Peter Phillips na Ọkparaeze Harry, Duke nke Sussex dịka a na-eme akwamozu Ọkparaeze Philip, Duke nke Edinburgh na Windsor Castle n'ụbọchị 17 nke ọnwa Epreelụ, 2021 na Windsor, Ịnglandị.

Vice Admiral Sir Timothy Laurence na Earl nke Snowdon bụ ndị nọ n'ahịrị na-eso ha, dịka ndị na-arụ ọrụ n'ezinaụlọ duke so ha n'azụ.

Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ erutela akwamozu nke Duke nke Edinburgh n'Ụlọụka St George, na Windsor Castle, Berkshire.

Tupu e mee mgbachi nkịtị nke otu nkeji maka duke, ụgbọala bu Ezenwaanyị rutere n'ụlọụka dịka a na-akpọ abụ ala. Ọ bara n'ime ebe Archbishọp nke Canterbury zutere ya.

Akpatiozu nke Duke nke Edinburgh nke e ji ọkọlọtọ ya kpuchie erutela Ụlọụka St George dịka a na-eme akwamozu nke Ọkparaeze Philip, Duke nke Edinburgh na Windsor Castle n'ụbọchị 17 nke ọnwa Epreelụ na Windsor dị n'Ịnglandị.
Akpatiozu nke Duke nke Edinburgh nke e ji ọkọlọtọ ya kpuchie erutela Ụlọụka St George dịka ndị na-ebu akpatiozu nke ndịagha nke ezinaụlọ eze bu ya n'akwamozu nke Ọkparaeze Philip, Duke nke Edinburgh na Windsor Castle n'ọnwa Epreelụ 17, 2021 na Windsor, Ịnglandị.
Members of the military stands outside St George's Chapel before the funeral service of Britain's Prince Philip, Duke of Edinburgh in Windsor Castle
Catherine, Duchess of Cambridge, arrives in the quadrangle ahead of the ceremonial funeral procession of Britain's Prince Philip, Duke of Edinburgh to St George's Chapel in Windsor Castle in Windsor,
Nkọwa foto, Catherine, Nwunye Ọkparaeze nke Cambridge, erutela ebe a ga-anọ mee akwamozu tupu o bido
The Duchess of Cornwall arrives at St George's Chapel, Windsor Castle
Nkọwa foto, Nwunye Ọkparaeze nke Cornwall erutela Ụlọụka St George
Members of the Household Cavalry are seen ahead of the funeral of Prince Philip, Duke of Edinburgh at Windsor Castle on April 17, 2021 in Windsor, England.
Nkọwa foto, A hụrụ ndị otu Household Cavalry tupu akwamozu amalite
Members of the Household Cavalry are seen ahead of the funeral
he Foot Guards Band are seen marching into position ahead of the funeral of Prince Philip, Duke of Edinburgh at Windsor Castle on April 17, 2021 in Windsor, England
Nkọwa foto, Ndị agha ji ụkwụ aga na-azọpụ ije n'ahịrị
1px transparent line
Members of a military band march into position at Windsor Castle in Windsor, west of London, on April 17, 2021, prior to the funeral service of Britain's Prince Philip, Duke of Edinburgh
The King's Troop, Royal Horse Artillery enter into Windsor Castle ahead of the funeral of Prince Philip, Duke of Edinburgh on April 17, 2021 in Windsor, England.
Nkọwa foto, Ndịagha Eze, Royal Horse Artillery na-erute nso Windsor Castle tupu e mee akwamozu
Members of The King's Troop Royal Horse Artillery arrive at Windsor Castle on the day of the funeral of Britain's Prince Philip, husband of Queen Elizabeth, who died at the age of 99, in Windsor, near London, Britain April 17, 2021

Narị kwuru narị mmadụ na-ele ka ndị agha Eze a kpọrọ King's Troop Royal Horse Artillery na-aga Windsor Castle n'ehihie.

Ọtụtụ ndị na-anya ịnyịnya yi uwe na-eji oji, na-acha ọbara ọbara nakwa ọlaedo, ma bukwa egbe atọ nya na-aga na Cambridge Gate dị n'ụlọ.

People on The Long Walk at Windsor Castle ahead of The funeral of Prince Philip
Members of The King's Troop Royal Horse Artillery are pictured on the day of the funeral of Britain's Prince Philip, husband of Queen Elizabeth, who died at the age of 99, in Windsor, near London, Britain April 17, 2021
A person salutes the King's Troop Royal Horse Artillery as they make their way down the Long Walk towards Windsor Castle, as the funeral of the Duke of Edinburgh takes place in St George's Chapel, at Windsor Castle, Berkshire

Ndị agha ga-agbapụ egbe nkeji site na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke mbaraezi nke Windsor Castle dịka e bu akpatiozu nke Ọkparaeze Philip site n'ụlọ na-aga ụlọụka.

King's Troop Royal Horse Artillery make their way up The Long Walk towards Windsor Castle ahead of the funeral of the Duke of Edinburgh in Windsor Castle, Berkshire. April 17, 2021

Ụfọdụ ndụ ọhanaeze agaala Windsor ịkwanyere duke ugwu, mana mpaghara ahụ dara jụụ n'ihi mmachi ndị e tinyere.

The King's Troop Royal Horse Artillery arrive at Windsor Castle for the funeral of Prince Philip, The Duke of Edinburgh on April 17, 2021 in Windsor, England.
Mourners gather outside Windsor Castle for the funeral of Prince Philip, Duke of Edinburgh on April 17, 2021 in Windsor, England.
Knitted post box toppers featuring Queen Elizabeth II and Prince Philip, Duke of Edinburgh are pictured in Windsor, west of London, on April 17, 2021
Members of the media gather outside Windsor Castle on the day of the funeral of Britain's Prince Philip, husband of Queen Elizabeth, who died at the age of 99, in Windsor, near London, April 17, 2021.

Duke nke Edinburgh ji aka ya họpụta ihe ya ndị a tụkwasịrị n'elu ọlta n'Ụlọụka St George na Windsor.

A tụkwasịrị ihe njirimara ya - ihe nrite nke mba Briten nakwa mba ndị dị n'okpuru Commonwealth nyere ya - n'elu akwa itoolu. O tinyekwuru ihe njirimara ya si na mba Denmark nakwa Gris iji kwanyere agbụrụ ebe o si ugwu dịka ọ bụ Ọkparaeze nke Gris na Denmark.

The Duke of Edinburgh's Insignia's placed on the altar in St George's Chapel, Windsor, ahead of his funeral.
Insignia belonging to Prince Philip, the Royal Victorian Order Collar and Badge, and the Royal Victorian Order Breast Star and Badge (front) and The Order of the Elephant (Denmark), and the Order of the Redeemer (Greece), are placed on the altar in St George's Chapel, Windsor
First light rises over Windsor Castle seen from across the River Thames on the Day of Prince Philip, The Duke of Edinburgh's funeral on April 17, 2021 in Windsor, England.

Foto niile a nwere ndị nwe ya.