Ikpe amaala Bill Cosby n'ebubo mwakpo nwaanyị
Mgbe e biputara ya
Bill Cosby

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe n'Amerika ekpebiela na ikpe mara onye ọkpaọchị bụ Bill Cosby n'ebubo atọ eboro ya dika onye na-awakpo ụmụnwanyị n'ike.
Ọ bụ Andrea Constand bụbu onye egwuregwu basketbọọlụ na-ekpe Cosby n'ụlọikpe ka mgbe afọ 2004.
Cosby dị afọ 80, ka na-agọ ebubo a, mana mkpebia nwere ike ị tinye ya na mkpọrọ ruo afọ iri atọ.
Nke a bụ ugboro abụọ Cosby na-azọ isi ya n'ulọikpe maka ebụbọ mwakpo ụmụnwaanyị.
Bill Cosby bụ onye ama ama na ihe onyonyo akpọrọ 'The Cosby Show' na bekee.
Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka na-ebo Cosby ebubo mwakpo n'ike mana Cosby kwuru na ha niile bụ asị.

Akụkọ ga-amasị gị:





























