Ụmụ Afrịka na-agbara ndị mba ọzọ bọọlụ

Iko mbaụwa
Nkọwa foto, Ibuli iko mbaụwa bụ ihe e ji anya isi nye obodo ọbụla buliri ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ka iko mba ụwa na-abịa nso, mba dị icheiche na-etinye aha ndị ga-agara ha asọmpi na Rọshịa, anyị na-etinye anya na ndị nwere ọbara Afrịka nwere ike iso mba ndị ọzọ sọọ mpi.

Dele Alli
Nkọwa foto, Dele Alli

Bamidele Jermaine Alli (Tottenham Hotspur, England)

Bamidele Jermaine Alli, nke a ma dịka Dele Alli, na-agbara ndị Tottenham Hotspur na otu egwurewgu bọolụ mba England. Nna Alli bụ onye Naịjirịa. N'asọmpị enyi na enyi ndị Naịjirịa na ndị England gbara nso nso a, ụfọdụ ndị Naịjirịa kworo ya ekwo n'ọgbọ egwuregwu, maka na okweghị agbara ndị Naịjirịa bọolụ mgbe akpọrọ ya oku.

N'Golo Kante
Nkọwa foto, N'Golo Kante

N'Golo Kante (France, Mali)

N'Golo Kanté bụ onye na-agbara ndi France bọọlụ ma na-agbakwa bọolụ na Chelsea. O bu ụzọ gba bọọlụ nke ukwuu n'otu egwuregwu Bologne nke France.

Kante gbaara ndị France bọọlụ tupu agbaa Euro 2016, ma gbaara ha bọọlụ n'asọmpi ahụ ka ọ jụrụ ịgbara ndị Mali bọọlụ. Nne na nna Kante si Mali gawa France n'afọ 1980.

Blaise Matuidi
Nkọwa foto, Blaise Matuidi

Blaise Matuidi (France, Angola)

Blaise Matuidi na-agbara ndị Juventus bọọlụ, ma na-agbakwara otu egwuregwu France bọọlụ dịka onye ọgba n'etiti.

Nne na nna Matuidi si Angola. Ha gara France mgbe Angola nọ n'agha.

Paul Pogba
Nkọwa foto, Paul Pogba

Paul Pogba (France, Guinea)

Paul Labile Pogba, na-agbara otu egwuregwu Manchester United na ndị mba France bọọlụ.

Amụrụ Pogba na France mana nne na nna ya bụ ndi Guinea. Ụmụnne ya abụo na-agbakwa bọolụ. Florentin, nke tọchasịri ha, na-agba bọọlụ n'otu egwuregwu Saint-Étienne, nke osote ya na-agbara ndị Sparta Rotterdam nke Holland nakwa otu egwuregwu nke Guinea.

Ụmụ nne ya họtara ịgbara ndị Guinea bọọlụ, mana ọ họtara France.

Gelson Martins
Nkọwa foto, Gelson Martins

Gelson Martins (Portugal, Cape Verde)

Gelson Dany Batalha Martins na-agbara otu egwuregwu Sporting CP na ndị Portugal bọọlụ. Ọ na-agba n'akụkụ.

Amụrụ ya na Cape Verde, ma ọ gara Paris mgbe ọ bụ nwatakịrị.

William Carvalho
Nkọwa foto, William Carvalho

William Carvalho (Portugal, Angola)

William Silva de Carvalho, na-agbara otu egwuregwu Sporting CP na Portugal bọọlụ. Amụrụ Carvalho n'Angola mana ọ gara Portugal mgbe ọ ka bụ nwata. Nna ya ochie na nwanne nna ya gbara bọọlu ọfụma n'Angola.

Presnel Kimpembe
Nkọwa foto, Presnel Kimpembe

Presnel Kimpembe (France, Congo)

Presnel Kimpembe na-agba bọọlu n'otu egwuregwu Paris Saint-Germain ma na-agbakwara mba France.

Amụrụ Kimpembe na France mana nne ya bụ onye Haiti ebe nna ya bụ onye Congo.

Benjamin Mendy
Nkọwa foto, Benjamin Mendy

Benjamin Mendy (France, Senegal)

Mendy na-agabara ndị Manchester City bọọlụ, ma sorokwa n'otu egwuregwu bọọlụ nke France. Nne na nna ya bụ ndị Senegal.

Steve Mandanda
Nkọwa foto, Steve Mandanda

Steve Mandanda (France, Congo DR)

Steve Mandanda, bụ onye nche goolu na-agabara ndị Marseille bọọlụ ma na-agbakwara ndị France.

Amụrụ Mandanda na Kinshasa - nke bụ isi obodo Democratic Republic of Congo - mana ọ bụ mba France ka ọ họtọra ịsọrọ mpi.

Nke mere ụmụnneya jiri na-akpọ ya "Frenchie" makana mmadụ atọ ọ tọrọ na-agabara ndị Congo bọọlụ.

Antonio Rudiger
Nkọwa foto, Antonio Rudiger

Antonio Rudiger (Germany, Sierra Leone)

Nna Antonio Rüdiger bu onye Germany mana nne ya bụ onye Sierra Leone. Ọ na-agbara ndị otu Chelsea nakwa Germany bọọlụ.

Sahr Senesie gbachitere Germany nakwa Borussia Dortmund bọọlụ bụ nwanne ya.

Romelu Lukaku
Nkọwa foto, Romelu Lukaku

Romelu Lukaku (Belgium, Congo DR)Romelu Menama Lukaku Bolingoli, na-agbara ndị Manchester United na otu egwuregwu mba Belgium bọọlụ.

Amụrụ Lukaku na Belgium mana nne na nna ya bụ ndi Congo. Nna ya bụ Roger Lukaku gbaara otu egwuregwu ndị Congo (mgbe a ka na-akpọ ya Zaire).

Nabil Fekir
Nkọwa foto, Nabil Fekir

Nabil Fekir (France, Algeria)Nabil Fekir na-agbara ndị Lyon na otu egwuregwu France bọolụ.

Ndị Algeria, bụ mba nne na nna ya si, kpọrọ Fekir ka ọ gbaara ha bọolụ n'afọ 2015 mana okweghị.

Kylian Mbappe
Nkọwa foto, Kylian Mbappe

Kylian Mbappe (France, Cameroon)Kylian Mbappé Lottin bụ onye egwu ndị Paris Saint-Germain na mba France.

Amụrụ Mbappé na Paris, nna ya bụ onye Cameroon ebe nne ya si Algeria. Nne ya kuburu bọọlụ aka.

Jerome Boateng
Nkọwa foto, Jerome Boateng

Jerome Boateng (Germany, Ghana)

Jérôme Agyenim Boateng na-agba n'azụ na Bayern Munich ma bụrụkwa onye otu egwuregwu ndị Germany.

Amụrụ Jérôme Agyenim Boateng na Germany mana nna ya bụ onye Ghana.

Ebe nwanne ya bụ Kevin-Prince Boateng, na-agbachitere ndị Ghana.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post