You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
E nwereike anya ụra na-eme Grok Ai - Inec
Onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi na teknụzụ n'ụlọọrụ Inec bụ Lawrence Bayode, ekwuola na anya ụra na-eme Grok bụ akụrụngwa Ai e ji achọpụta okwu bụ eziokwu na akara soshal midia X ma kwuo na Onyeisioche ha bu Joash Amupitan enweghị akara X ọbula.
Nke a na-abịa dịka e boro onyeisioche Independent National Electoral Commisiion (Inec) bụ Joash Amupitan ebubo iwepụta ozi n'akara soshal midịa X nke gosiri na ọ kwadoro pati All Progressives Congress (APC) na ntuliaka afọ 2023.
Bayode kwuru kpọm kwem na n'agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ mere nnyocha forensic, enweghị nnyocha forensic ọbụla chọpụtara na ọ bụ onyeisioche Inec wepụtara ozi ahụ.
O kwuru na onye ọbụla nwereike iji aha onye ọzọ mepee akara soshal midịa ma kwuo na ebubo ahụ e boro onyeisioche Inec nwereike ịbụ mmadụ onye ọzọ ji aha Amupitan mepee aka X ahụ.
Ọ kọwara na Inec kwenyere n'ihe akaebe, ọ bụ ya mere ha ji nyefee okwu ahụ n'aka ndị ọrụ nchekwa ka ha mee nnyocha iji chọpụta nke bụ eziokwu n'ebubo ahụ ma kwuo na Inec ga-ahọpụta onye ọrụ na-eme nnyocha forensic ga-emekwa nnyocha zuruoke n'ebubo ahụ.
Gịnị bụ Grok Ai?
Grok bụ akụrụngwa Ai soshal midia X wepụtara nke nwereike ime nnyocha, mepụta foto, vidio, edemede, okwu ọnụ nakwa ihe ndị ọzọ nke na-abụghị eziokwu.
N'ọnwa Jenụwarị 2026, foto ebe Onyeisiala Bola Tinubu na Onyeisiala mba Rwanda bụ Paul Kagame zutere onwe ha nke nwere njirimara Grok gbara n'anwụ ma mee ka ọtụtụ mmadụ malite ịjụ ka nzute ahụ ọ bụ eziokwu ka ọ bụ ụgha.
Mana ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga kwuru na ọ bụ eziokwu na Onyeisiala Tinubu na Onyeisiala Kagame zutere onwe ha kama na e ji akụrụngwa Grok wulite ọnọdụ foto ahụ iji chọọ ya mma.
N'oge gara aga, ọtụtụ akụkọ nakwa ebubo dị iche iche pụtara banyere akụkọ nakwa okwu ụfọdụ e ji Ai mepụta nke butere ọgbaghara nakwa nụrịtaụka.