Ihe na-eme ugbua n'esemokwu Peter Obi na Chukwuma Soludo

Peter Obi na Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Peter Obi, Chukwuma Soludo/X

    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Lagos
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Onye nchịkọta otu Obidient Movement bụ Yunusa Tanko ewepụtala ibe akwụkwọ ndekọ nke Peter Obi jiri nyefee ọchịchị n'aka Willie Obiano n'afọ 2014.

Akwụkwọ ndekọ ahụ Tanko wepụtara gosiri na Peter Obi hapụrụ ijeri naịra asatọ na isii na ụma iri isii na asaa (N86.67bn) n'akpaego Anambara Steeti na ngwụcha ọchịchị ya.

N'ụbọchị Wenezde 16 Septemba 2026, Tanko wepụtara ozi o bipụtara n'akara X ya dịka a gara n'ihu na-enwe nrụrịtaụka n'etiti Peter Obi na Gọọmentị Anambara Steeti nke Chukwuma Soludo nọ n'isi ya gbasara ego steeti ahụ gbazitere nakwa ụgwọ ndị ha ji oge Obi pụrụ n'ọchịchị.

N'ozi ahụ, Tanko mara ndị gọvanọ chịrị steeti Anambara Steeti kemgbe afọ 1999 aka n'ihu ka ha wepụta akwụkwọ ndekọ ha jiri nyefee ọchịchị n'ihu ọhanaeze.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Dịka nke a na-eme, Kọmịshọna Anambara Steeti bụ Law Mefor akọwaala ihe mere gọọmenti steeti ahụ jiri wepụta ihe ndekọ gosiri ụgwọ niile steeti ahụ ji oge Peter Obi pụrụ n'ọchịchị.

N'ozi Mefor bipụtara n'akara Facebook ya n'ụbọchị Tọzde 17 Septemba 2026, o kwuru na ha wepụtara ihe ndekọ ahụ iji kwado okwu Gọọmenti Anambara kwuru na ha ka na-akwụghachi ụgwọ ọchịchị ndị pụrụ apụ na steeti ahụ jikọrọ, nke gụnyere ọchịchị Peter Obi.

"Ha sịrị anyị nye ha ihe akaebe, anyị ewepụtala ihe akaebe. Ọ bụrụ na ha maa anyị aka ọzọ, anyị ga-amalite ibupụta ihe niile, malite n'ozi na-egosipụta ka si mefuo ego n'ụlọakụ".

"Ọ bụrụ na ha abụghị ego mgbazinye, ma bụrụ onyinye, gịnị mere Anambara ji na-akwụghachi ha"?

"Ọ bụrụ na ọ bụghị steeti niile naara ego mgbazinye ahụ, gịnị mere Anambara ewepụghị onwe ya dịka ndị ahụ na-esonyeghị"?

"Ọ bụrụ na Gọọmenti Etiti bụ ya gbazitere ego ahụ, gịnị mere ọ bụghị Gọọmenti Etiti na-akwụghachi ya?" ka Mefor jụrụ.

Peter Obi na Chukwuma Soludo: Lee nke na-akpọtụ ọzọ

Gọvanọ Anambara steeti bụ Chukwuma Soludo, na Peter Obi chiburu Anambara steeti.

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook

Nkọwa foto, Peter Obi na Chukwuma Soludo

Kemgbe abalị ole ma ole ugbua aha Gọvanọ Anambara steeti bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo na Peter Obi bụbu Gọvanọ chiburu steeti ahụ ma jiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị Nigeria Democratic Congress (NDC) na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2027 na-abịa abịa bụ okwu a kpụ nọ ọnụ na soshal midia.

Ihe na-akpọtụ ugbua gbadoro ụkwụ na ọ bụ eziokwu na Peter Obi e ji ndị mmadụ ụgwọ dịka Gọvanọ maọbụ na o jighị onye ọbụla ụgwọ mgbe ọ chịchara dịka gọvanọ Anambara steeti.

Etu ihe si dị, gọọmenti Anambara steeti na-ebo Peter Obi ebubo iji ndị mmadụ ụgwọ mana Obi na-ekwu na ebubo ahụ abụghị eziokwu.

Etu ihe niile si bido

Ihe a niile bidoro n'oge Komishịọna na-ahụ maka ego n'Anambara steeti bụ Izuchukwu Okafor pụtara kwuo na gọọmenti steeti ha ka na-akwụghachi ụgwọ nakwa ego mgbazite ndị chiburu steeti ahụ ji n'ụgwọ ma nke ha sị na Peter Obi gbazitere.

Izuchukwu Okafor kwuru nke ahụ n'onyonyo fesara agharaaghara na soshal mịdịa ma kwuo na ego ahụ so na nke Gọọmentị Peter Obi nakwa Gọọmenti Willie Obiano gbazitere mgbe ha chịrị steeti ahụ.

Mana cheta na Peter Obi ekwuola ugboro ugboro na mgbe ya chichara dịka Gọọmenti Anambara na steeti ahụ ejighi ụgwọ ọbụla kama na ya dosere ego n'ọba ụlọakụ ruru naịra Ijeri naira 75 (N75billion) dị n'ụlọakụ First bank.

Ebubo Gọọmenti Anambara steeti boro Peter Obi na nkenke

Mana n'akwụkwọ Komishịọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Anambara steeti bụ Law Mefor wepụtara ka ọ sị na ọchịchị Chukwuma Soludo na-akwụghachi ụgwọ ego ruru (N22 biillion) bụ ego Gọọmenti Peter Obi ji ndị ọrụ steeti nakwa nke okpuruọchịchị lala ezumuike ọrụ nakwa ndị nkuzi.

Ọ sị na "e ji ndị ọrụ ụgwọ ahụ n'oge Peter Obi na-achị ma ruo na Gọọmenti Soludo abata ma bidon a-akwụ ya".

Akwụkwọ gosiri ebubo Gọọmenti Anambara steeti boro Peter Obi

Ebe foto si, Law Mefor/Facebook

Mefor gara n 'ihu kwuo na "Peter Obi akwụchaghị ego ụgwọọnwa e ji ndị ọrụ n'ụlọọrụ 'Water Corporation' bụ nke mechere bụrụ nke okwu ya gara n'ụlọikpe n'oge ọ na-achị".

Ọ sị na Peter Obi akwụghịkwa ụgwọ nke ọchịchị Gọvanọ Mbadinuju ji ndị nkuzi, ndị lala ezumuike ọrụ, ma kwuo na Peter Obi kwụrụ naanị ọnwa ise n'ime ọnwa iri na isii bụ ụgwọọnwa e ji ndị ọrụ n'ọchịchị Mbadinuju".

Ọsịsa Peter Obi nyere maka ebubo ndị a

Peter Obi kọwara ebubo ndị ahụ niile dịka ashị ọcha.

N'okwu Peter Obi "anyị kwụchara ụgwụọnwa e ji ndị mmadụ ọtụtụ afọ garaaga tupu mgbe m n'apụ n'ọchịchị Anambara steeti ejighi onye ọbụla ụgwọ".

"Ma nke ha sị na m "ji ụgwọ ego nakwa nke 'Ecological Loan' bụ nnukwu okwu ụgha.

"Ma nke ha sị na ọchịchị m akwụghị ụgwọ gọọmenti chiburu tupu anyị abanye ọchịchị bụ ego ruru ijeri naira abụọ (N2billion) bụ ego e ji ndị rụrụ gọọmenti ọrụ, ụgwụọnwa, ego ezumuike nke ndị ọrụ bụkwa okwu ụgha".

Peter Obi kwuru na ego 'Ecological fund' ruru ijeri naịra abụọ (₦2 billion) ha na-ekwu maka ya batara n'akara ụlọakụ Gọọmenti Anambara steeti n'ihe dịka ọnwa atọ mgbe ya chọrọ ịchịcha ọchịchị. Ọ sị n'agbanyeghị na ndị mmadụ chọrọ ka ha nwere ego ahụ rụọ ọrụ mana ya hapụrụ ya n'ụlọakụ ma kwuo ka gọọmenti ọzọ na-abịa nwee ihe o ji bido ọrụ.

Peter Obi chiburu Anambara steeti ma bụrụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2027.

Ebe foto si, Peter Obi / Facebook

Nkọwa foto, Peter Obi

Obi sị na ego ahụ bụ ego ndozi ebe mbuze na-enye nsogbu n'Oko/Umuchiana ma kwuo nay a hapụrụ ego ahụ n'ụlọakụ First Bank, nke akara ya bụ 'AC/No. 2018779464' ma kwukwa na ego dị n'ụlọakụ ahụ mgbe ya hapụrụ ya bụ Ijeri naịra abụọ nan de naịra iri na atọ '(₦2.13 billion)'.

Obi gara n'ihu kwuo na ego ya hapụrụ n'ọba ma dosere gọọmenti Anambara steeti karịrị ijeri naịra iri asaa na ise (N75billion).

Ọ sị na nke a esoghịkwa n'oge ndị ọzọ bụ nke ya hapụrụ ma hara imetụ ya aka bụ ego e wepụtagoro ihe e ji ya arụ tupu ọchịchị ya agwụ.

Ọ sị "ọ bụrụ nao nye ọbụla apụta kwuo na ihe ya kwuru abụghị eziokwu ma nwete ihe akaebe nay a ga-akwụsị ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2027.