Zack Orji: Anaghị m ebi ndụ na soshal midia

Aha onyonyo, Zack Orji: Anaghị ebi ndụ soshal midia
Zack Orji: Anaghị m ebi ndụ na soshal midia
Zack Orji aka ochie n'ejije Nollywood
Nkọwa foto, Zack Orji aka ochie n'ejije Nollywood
Mgbe e biputara ya

Zack Orji bụ onye ejije Nollywood a ma ama bụ onye ọtụtụ kpụ n'ọnụ ugbua na soshal midia. Orji ekwuola na ya anaghị ebi ndụ nke ya na soshal midia.

O kwuru na soshal midia na-anapụ ndị mmadụ oge ha kwesịrị iji mee ihe dị mkpa. Orji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n’afọ 2020 oge ọrịa Covid-19 ji ọgbọ na Naijiria nke mere ka gọọmentị tinye mmachi ngagharị ndị mmadụ.

Orji bụ e chiri ụkọchukwu n’ụka ‘Powerline Bible Church’ kwuru na ọrụ ịgbasa oziọma Kraịsti ebugala mba dị iche iche na Naijiria, n'Alabekee nakwa ụfọdụ mba n'Afrịka.

N'okwu etu o siri malitere ọrụ ime ejije, o kwuru na ọ bụ ọrụ igo ihe ubi ma na-ebupụ ya ka o nwetara ohere isonye n’ejije.

Kirie ya n'uju.

Zack Orji malitere ime ejije na Nollywood kemgbe gboo n'oge gara aga.
Nkọwa foto, Zack Orji malitere ime ejije na Nollywood kemgbe gboo n'oge gara aga.

I kwesịrị ịma maka Zack Orji

  • Ọ bụ onye na-eme ma na-ahazi ejije Nollywood a ma ama
  • Zackee Ama Orji, bụ nwa afọ Igbo mana a mụrụ ya na mba Gabon
  • Ọ gara mahadum 'University of Nigeria Nsukka'.
  • Ejije mere ka ọ chakee bụ "Glamour Girls", na "Blood Money" mana o sonyela n'ọtụtụ ihe nkiri ndị ọzọ.
  • Ọ bụ onye ụkọchukwu ugbua mana o nweghị ụka nke aka ya.