Ihe mere m ji sepụ aka n'ịzọ ọkwa Gọvanọ na Riva Steeti – Gọvanọ Fubara

Ihe mere m ji sepụ aka na ntuliaka imeụlọ APC na Riva Steeti – Gọvanọ Fubara

Ebe foto si, Siminalayi Fubara

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Aka na-achị Riva Steeti bụ Siminalayi Fubara ekwuola na ya ewepụla aka na ntuliaka imeụlọ nke pati All Progressives Congress (APC) maka ịzọ ọkwa gọvanọ na 67steeti ahụ.

Fubara kwupụtara nke a n'ozi o wepụtara n'onwe ya n'ụbọchị Wenezde 20 Mee 2026, ma kwuo na ya ga-akwado onye ọbụla pati ahụ họpụtara maka iji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa gọvanọ.

Ozi ahụ Fubara wepụtara sịrị: "Dịka m chebachara echiche ime ma kpọtụrụ ndị ezinaụlọ m, ndị enyi m na ndị mụ na ha na-emekọrịta ihe, enwere m mkpebi a siri ike isepụ aka na ntuliaka imeụlọ nke pati APC".

"Eji m obi m niile mee nke a, ma dịkwa njikere ịkwado onye ọbụla nnukwu pati anyị ga-ahọpụta maka ịzọrọ ha ọkwa gọvanọ."

Fubara kwuru na Riva Steeti dị ukwuu karịa mmadụ ọbụla, ma rụtụ aka na ihe kachasị mkpa n'oge a bụ udo na ịdịnotu nke steeti ahụ karịa mmasị nke onwe.

Tonye Cole esepụkwala na ntuliaka ime ụlọ APC maka ịzọ ọkwa gọvanọ na Rivas Steeti

Tonye azọọla ọkwa gọvanọ ọtụtụ ugboro na Rivas Steeti

Ebe foto si, Tonye Cole

Nkọwa foto, Tonye azọọla ọkwa gọvanọ ọtụtụ ugboro na Rivas Steeti

N'otu Tonye Cole, onye gbagotere elu so n'azọ ọkwa gọvanọ na Rivas Steeti n'aha pati APC esepụkwala aka n'isonye na ntuliaka ime ụlọ nke pati ahụ.

N'akwụkwọ ozi o wepụtara na Wenezde, Cole kwuru na o mere nke a iji mee ka udo na ịdịnotu chịa na pati ha.

O kwuru na o mere mkpebi ahụ site na mkparịtaụka na ịjụ ese ya na ndị ndu pati ha, ndị ogbo na ndị nkwado ya nwere.

O kwuru na ọ ga-aga n'ihu ịkwado onye ọbụla a họpụtara dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ na Rivas steeti n'aha pati ha bụ APC.

Ọ rịọrọ ndị nkwado ya ka ha dere jụụ ma mịnye mma ha n'ọbọ ma rụkọọ ọrụ maka ọdịmma pati ha iji kwadoo maka ntuliaka afọ 2027.