Okwu ndị uweojii maka okpokoro isi mmadụ 28 ha chọpụtara n'Abia

Aha onyonyo, Okwu ndị uweojii maka okpokoro isi mmadụ 28 ha chọpụtara n'Abia
Okwu ndị uweojii maka okpokoro isi mmadụ 28 ha chọpụtara n'Abia
Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii Abia steeti kwuru na ha achọtala okpokoro isi mmadụ ruru iri abụọ na asatọ (28) tinyekwara ọkpụkpụ mmadụ n'otu okeọhịa dị na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Maureen Chinaka kwuru na ha mere nchọpụta a n'ụbọchị Sọnde 27 Septemba 2026.

N'ozi o wepụtara, Chinaka kwuru na ngalaba ndị uweojii Violent Crime Response Unit (VCRU), Anti-Kidnapping Unit, Anti-Cultism Unit, Intelligence Response Unit (IRU), Rapid Response Squad (RRS) nakwa ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Isuochi jikọtara aka kpaa ike ahụ.