Aka akparala ndị tọọrọ ndị ụka Katọlik n'Enugwu Steeti ebe a zọpụtara ndị ha tọọrọ

Ebe foto si, Enugu State Government
A zọpụtala ndị ụka St. Joseph Katọlic dị n'Inoyi Affa nke okpuruọchịchị Udi Enugwu Steeti bụ ndị a tọọrọ n'ime ụlọụka na Sọnde ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọst 2026.
Ndị a tọọrọ nwere onwe ha ugbua gụnyere onye seminarịa bụ Lawrence Igbo na onye ọzọ bụ Mazi Emmanuel Onwudi.
N'ozi odeakwụkwọ gọọmentị Enugwu Steeti bụ Chidiebere Onyia wepụtara, ọ kọwara etu e si zọpụta ndị a.
O kwuru na ndị ọrụ nchekwa gụnyere DSS, ndịagha, ndị uweojii na ndị Forest Guard ji akụrụngwa na ọgụgụ isi nnyocha chọpụta ebe ndị ntọrị ahụ nọ, ha kwakọrịtara mgbọ nke mere e ji gbagbuo otu onye ntọrị ma jide mmadụ atọ ndị ọzọ.

Ebe foto si, Enugu State Government
Onyia kọwara na ha ji ego mgbapụta a kpọrọ "Ransome" wee gbaara ndị ntọrị ahụ ọnya bụ nke ha dabara.
O kwukwara na ha eweghachịla ego ahụ niile a kwụrụ ndị omekome ahụ.
Gọvanọ Peter Mbah nke Enugwu Steeti kwuru na onye ọbụla na-akpa ike ọjọọ n'Enugwu agaghị ezonahụ gọọmenti na akụrụngwa ihe onyonyo ọhụrụ ha ji enyocha gburu gburu Enugwu niile.
Ndị ọrụ nchekwa napụtara ndị ntọrị ahụ egbe AK 47 anọ na mgbọ egbe karịrị otu narị na iri atọ na atọ (133).
Mgbe ụmụnwaanyị Affa mere ngagharịiwe maka ndị a tọọrọ

Ebe foto si, Screen shot
Ụmụnwaanyị obodo Affa mere ngagharịiwe maka mwakpo ndị ojiegbe wakporo ụlọụka ahụ ma tọọrọ mmadụ abụọ.
Ụmụnwaanyị kpagharịrị n'okporoụzọ obodo ha na-agbanyeghi mmiri na-ezo na-ama ha ma rịọ ka gọọmenti gbatara ha ọsọ enyemaka maka ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa.
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ka ụmụnwaanyị bucha ahịhịa na-abịa n'etiti okporoụzọ dịka ha na-abụ abụ na ukwe.
Ha kọwara na ụlọụka bụ ebe a na-ahụta dịka ebe izere ndụ site na nsogbu ọbụla abụrụ ebe ndị ekperima na-eme mwakpo na-atụghị egwu ọbụla.
In the video seen by SaharaReporters on Monday, the leading spokesperson was seen wailing openly in the rain.
Ha kpọkuru gọvanọ Peter Mbah na-achị steeti ahụ, onyeisioche okpuruọchịchị Udi bụ Hyginus Agu na Sịnetọ Osita Ngwu na-anọchiteanya ka ha biko gbapụ ọsọ n'iwete ezi nchekwa n'obodo ha.

Ebe foto si, Screen shot
Etu ndị ntọrị ahụ siri wakpoo ụlọụka Katọlik ahụ

Ebe foto si, Enugu State Police
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ pụtara n'ụtụtụ Sọnde ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọst kwuru na ndị ojiegbe wakporo ụlọụka St. Joseph Katọlik dị n'obodo Inoyi Affa nke okpuruọchịchị Udi n'Enugwu Steeti.
N'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ka ọtụtụ ndị obodo ahụ na-eti mkpu ma kọwaa na ndị ojiegbe tọọrọ otu onye Seminarịa, otu katikist na otu onye ọzọ mgbe ha na-akwado imalite ofufe n'ụlọụka ahụ.
Ha kwuru na ndị ojiegbe a ruru mmadụ iri bucha egbe AK47 ma na-agbali ya elu dịka ha kpọọrọ mmadụ atọ ahụ si n'ụlọụka na-apụ nke mere na ndị mmadụ enweghi ike chụnwuo ha ọsọ.
Otu nwoke na-ekwu okwu n'ihe onyonyo ahụ na-akpọghị aha ya sị na e mechara tọhapụ katikist ahụ ma jidezie onye seminarịa na otu onye ọzọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị obodo pụtara n'igwe ma kpagharịrị n'ime ọhịa ịchọpụta ebe ndị a zoro mana o nweghizi ndị ha hụrụ.
Onyeisioche okpuruọchịchị Udi bụ Ogbonnaya Agu mechara duru ndị ọrụ nchekwa wuchie n'obodo ahụ mana ha ahụghị ndị ntọrị ahụ.
Kọmishọna Uweojii Enugwu Steeti bụ Mamman Bitrus Giwa kwuru na ha ehiwela otu ndị ọrụ nchekwa 'Joint Task Force' n'obodo Inoyi Affa ebe ihe a mere.
Giwa kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa chụrụ ndị ntọrị a ọsọ nke mere ha jiri hapụ otu onye n'ime ndị ha tọọrọ.
Giwa kwere nkwa na aka ndị ọrụ nchekwa ga-akpara ndị ahụ n'oge na-adịghị anya.
Ọ gwara ndị mmadụ ka ha weta ozi ịgba ama ọbụla ga-enye aka ijide ndị omekome ahụ ma zọpụta ndị ahụ ha tọọrọ ozigbo ozigbo.






























