Eziobodo: Ihe anyị ma maka mwakpo a sị ndị ọchịehi mere n'Imo steeti

Ndị obodo Eziobodo dị n'Okpuru ọchịchị Owerri-West' n'Imo steeti etiela mkpu arịrị maka mwakpo ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchiehi na-eme n'obodo ha nsonso a.
Ọtụtụ onyonyo fegharịrị na soshal midia ụbọchị Wenezde gosiri ebe ndị mmadụ na-agba ọsọ onye-ghara-ibe-ya n'obodo ahụ.
Ihe onyonyo ọzọ gosiri otu nwoke onye ọkada ọbara juru ahụ. Nwoke ahụ kwuru na a wakporo ya dịka o bu onye njem gaa Eziobodo.
Ọ kọwara na ndị wakporo ya dị atọ, ha nyi uwe ojii. Ọ gara n'ihu kwuo na ha gbara ya egbe ma merụọ ya ahụ oge ha zutere ha.
Nke a na-abịa dịka a na-ebo ebubo na ndị e chere na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ebe dị iche iche n'obodo Eziobodo n'ụbọchị Wenezde, gbuo mmadụ abụọ, merụọ ọtụtụ ahụ ma tọọrọ ụfọdụ.
Mana ndị uweojii Steeti ahụ asabeghị okwu BBC zigara ha maka ebubo ndị a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye azaghị ekwentị ya tupu akụkọ a apụta.
Mana otu onye bi n'Imo steeti achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na mwakpo ahụ mere n'ebe atọ n' ụbọchị Wenezde.
O kwuru sị, "Ha gbagburu otu nwoke ma tọọrọ ndị ọzọ a mabeghị ọnụọgụgụ ha."
Otu nwata akwụkwọ mahadum 'Federal University of Technology Owerri' (Futo) bụkwa onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ya bi nso ebe ihe ahụ mere.
Ọ sị na 'Otu nwoke kwọ ụmụ ya n'ụgbọala na-aga njem so na ndị a wakporo mana nwoke ahụ hapụrụ ụmụ ya gbalaga tupu ndi uweojii awụchie nye ndị ntọ ahụ ọsọ."
Ndị bi n'Eziobodo kọwara na mkpamkpa ndị ọchiehi rịrị elu n'obodo ha na nsonso a.
"Ha tọọrọ m, mana e ji otu nde naira gbapụta m'
Na nsonso a, mwakpo ndị ntọrị rịrị elu dịka ọtụtụ ndị mmadụ gabigara nsogbu ntọrị n'Eziobodo na gburugburu ya.
Otu nwaanyị ndị ntọrị tọọrọ ụbọchị Fraide, abalị asatọ nke ọnwa Mee (8/5/2026) gwara BBC Igbo na ya na nwa ya nọ na ọkada aga njem oge ndị ntọrị wakporo ha, ma nwụrụ ha banye n'ime ọhịa.
Nwaanyị ahụ kwuru na ha tọghapụrụ ya ka abalị abụọ gachara n'Ụbọchịụka (abalị 10 nke ọnwa Mee, afọ 2026).
O kwuru na, 'di m kwụrụ ha otu nde naira tupu ha ahapụ m."





























